Beverly Osu o mere ihe ọjọọ iyi uwe ndị Katọlik?

Kamgbe foto ebe Beverly Osu bụ otu onye na ndị mere ihe nkiri "Big Brother Africa 2013" yi uwe ndị sista Katọlik ma kpara sịga na 'chapụlet' n'aka pụtachara n'elu soshal midia, ebe ahụ e nwurula ọkụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ tụmadụ ndị ụka Katọlik akatọọla ya bụ foto ma na-adọ ya aka na ntị ka ọ kwanyere ihe niile gbasara ụka ha ugwu.

Mana ebe Beverly ji nke ya see naanị foto nke akwụkwọ magazịn, ọtụtụ ndị ọcha dịka otiegwu Rihanna, Nicki Minaj na ndị ọzọ ejirila ya pụta n'ọgbọ n'emume dịka 'Met Gala: Heavenly Bodies' na 'halloween', mere ụfọdụ ndị nwere ike ghara ịhụta ya ka ihe ọjọọ.

Ndị katọrọ ya na Twitter:

@I_pissVodka kwuru na Beverly kara iyi uwe ndị ekpere alakụba.

@theDamorela kwuru na Beverly ji ihe e ji eme ekpere na-eme ihe akaja.

@TWEETORACLE kwuru na dịka onye Katọlik ọ bụ, o chere na Beverly zuzuru ezuzu.

Ndị akatọghị ya:

Mana @Dr_Aphiz kwuru na Beverly ji ejiji ahụ na etu o si kpara 'Rosary' nakwa sịga n'aka wee na-ezisa ozi.

@JAYWONJUWONLO sị na onweghị ihe dị njọ n'uwe ndị sista katọlik nwata nwaagbọghọ ahụ yi.

@sirucheagbo kwuru na ihe Beverly mere bụ i gosipụta nka, ma ọ masịrị ndị mmaọ̄ụ ma ọ masịghị ha, ihe o gosiri bụ nka.

@ogechime1 sị na agbanyeghị na ọ bụ onye ụka Katọlịk na o nweghị ihe ọ hụrụ dị njọ n'ihe Beverly mere.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: