Iwu amachighi ndị Ipob ị nọ n'ụlọ - Ọkaiwu
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

IPOB: Ndị uweojii enweghi ikike ịmachi iwu Ipob

N'ajụjụ BBC Igbo jụrụ ọkaiwu Obele Chuka bụbu onyeisi otu ndị ọkaiwu akpọrọ NBA n'ịchafụ nke Nnewi, ma iwu ọ machiri ị nọ n'ụlọ ndị Ipob sịrị ka ndị mmadụ mee.

O kwuru na onweghi iwu machiri ndị mmadụ i gosipụta iwe ha site n'ịnọ n'ụlọ. N'ihi na ihe a na-eme ndị Igbo adịghị mma.

Chuka kwuru na ụlọikpe Naịjirịa ekwuola na ndị uweojii enweghi ikike ọbụla inye ndị mmadụ akwụkwọ eji eme ngagharị iwe.

N'otu aka ahụ, ọtu dị iri na abụọ gbakọtara n'Enugwu ma kwadoo iwu ị nọ n'ụlọ ndị Ipob hiwere n'abalị iri na anọ nke ọnwa Seputemba, afọ 2018.

Onye kpokọtara otu ndị ahụ bụ osote onyeisi Ndị Eastern Consultative Assembly bụ Maria Okwor.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ipob na Massob bụ otu abụọ chọrọ nwereonwe Biafra

Okwor kwuru na ihe mere ha ji akwado ị nọ n'ụlọ bụ maka mmekpa ahụ e mere ụmụnwaanyị n'Owere.

Ndị bịara n'ọgbakọ ahụ gụnyere ndị Eze, ndị isi ọdịnala, ndị na-azụ ahịa nakwa ụmụakwụkwọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: