Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: George Weah emeela ihe o jiri bụrụ dike
Akụkọ ndị dị mkpa:
N'egwuregwu,
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Liberia George Weah gbara ala ya bọọlụ ụnyaahụ mgbe ha na Naịjirịa sọkọtara mpi enyi na enyi na Monrovia.
Nke a mere iji kwanyere uwe nke akara ya bụ iri na anọ ugwu ikpeazu dịka ya bụ uwe ga-ala ezumike nka na Liberia.
Ọzọ,
Aka na-achị Enugu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi amanyela kọmitii ga-ahụ maka nwulite ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.
O kwuru na ọ dị mkpa ka ọdịda anyawu nwee ọdọụgbọelụ nke mba ofesi nakwa na ọ ga-ahụ na e mezuru ya.
Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ebe n'ala Igbo enweghị ihe gosiri ọrụ gọọmentị steetị ha maọbụ nke gọọmenti etiti
Gọọmentị etiti enyela steeti dị icheiche iwu ha ga-emezu maọbụrụ na ha chọrọ iketa oke n'ime ego akpọrọ Paris Club refund.
Ihe ndị a gụnyere ịkwụ ndịọrụ ụgwọ ọnwa nakwa ị kwụghachị ego niile ha bitere n'aka gọọmentị etiti
Na mba ofesi,
Naanị otu ọdọ ụgboelu na-arụ ọrụ na mba Tripoli agbachiela n'abali Tuusde mgbe a tụrụ ya ogbunigwe.
Rue ugbua amabeghị ma o nwere onye nwụrụ maọbụ ihe mere mmebi na ya bụ ọdọ ụgbọelu.
Gee nkeji nke ụtụtụ a:
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile
Ihe onyonyo nke taa:
'Not to young to run' abụghị maka ogbenye ọnụ ntụ - APC