'A chọtala nwa m nwaanyị furu kamgbe ọnwa Mee'
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

'A chọtala nwa m nwaanyị e zuru kamgbe Mee' - Nne nwa

Nne nwantakịrị nwaanyị bụ Blessing Adaobi, onye na-efu efu kamgbe ọnwa Mee afọ etiela mkpu ọṅụ dịka ndị uweojii chọtara nwa ya nwaanyị na ndụ.

Blessing bidoro ifu oge onye ọbịa agbataobi ha kpọrọ ya pụọ nke mere ahụghịzi ya rue ugbua.

Mana nne ya bụ Kosarachukwu Onumaegbu gwara BBC Igbo na ndị uweojii jidere otu nwaanyị aka ya dị wee ree nwa ya ahụ bụ onye kọwara na ikpeazụ ya hụrụ Adaobi bụ n'isi mmiri Ọnịcha.

O kwuru na ndị uweojii ahụ gara Ọnịcha mana ọ bụrụ na e rekwala Adaobi gaa Ebonyi steeti.

Kosara kwuru na oge ndị uweojii ahụ ruru n'Ebonyi steeti, e kwuru na onye zụrụ Adaobi nwa ya anwụọla mana ndị agbataobi nọ na-eleta ya.

O tipuru mkpu ọṅụ wee kọwara BBC Igbo na otu ihe nyere ya obi isi ike oge a niile bụ na ya nwere nchekwube na nwa ya ka dị ndụ.

Kosara kwuru na nwa ya ga-alọta tupu ụbọchị ụka.

BBC Igbo ga-ewetakwara gị akụkọ oge ọ lọtara.

Isiokwu Ndị Emetụtara