HSBC: Buhari chịa ọzọ, ọ ga-emetụta akụnaụba Naịjirịa
Akụkọ gbapụtara ihe taa
Ihe mberede okporụzọ egbuola mmadụ anọ n'Enugwu
Ebe foto si, Chiagozie Nwonwu
Ifeanyi Okorie
Taa bụ ụbọchị akwa dịka ihe mberede okporoụzọ tara isi mmadụ anọ na Nkwe, n'okpuru ọchịchị Awgu n'Enugwu steeti.
Mmadụ anọ ahụ gụnyere ọkwọụgbọala na ụmụnwaanyị atọ ndị ọzọ gara ịzụta ahịa n'ime obodo ahụ.
Kwụsị ịkwado ndị ohi na Naịjirịa - Gọọmenti
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla ụlọakụ ukwu na mbaụwa bụ HSBC n'ịchafụ maka amụma ha buru na nhọpụta Buhari ọzọ ga-ala akụnaụba Naịjirịa n'iyi.
Ha gara n'ihu kwuo na ụlọakụ a na-enyere ndị mmadụ aka izu akụnaụba Naịjira ka ha gbaa mbọ weghachị ego Naịjirịa e zuru bụ nke dị n'aka ha.
Ihe oke ifufe akpọrọ Florence na-eme n'Amerịka nakwa ihe'Typhoon' na-eme na China
Ebe foto si, Getty Images
Na mba ofesi, oke ifufe na mmiri nke Florence zutere Nọt Karolina ebelatala mana a na-ekwu na idemmiri ya nwereike iba obodo ndị ọzọ.
Ya bụ mmiri ozuzo jizi nwayọọ aga mana ọ na-echezi ihu na steeti Ohio
Ebe foto si, Getty Images
N'aka nke ọzọ oke ifufe na mmiri ozuzo jikwa mba China n'ọrụ dịka a na-ekwu na nke a bụ ebili mmiri kachasị zutere ha.
N'egwuregwu
Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, nwa Kenya bụ Eliud Kipchoge adọkala akwụkwọ ndekọ n'egwuregwu ịgba ọsọ maratọn na Berlin taa, ebe o ji nkeji iri atọ na itoolu belata oge e ji agba ya bụ ọsọ.
Ebe foto si, Getty Images
N'aka nke ọzọ, ọgba bọọlụ Christiana Ronaldo enyela goolu mbụ ya n'otu egwu bọọlụ Juventus bụ ndị goro ya ọhụrụ.
Nkeji nke mgbede a
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Mmepe ụlọọrụ PDP n'Anambra Steeti
Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii e mepeela ụlọọrụ pati PDP dị n'Anambra steeti bụ nke ha mechiri n'ihi ọgbaghara dị bu n'etiti ndị pati ahụ.
Ha mere nke a mgbe ndị PDP na komishiona ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed nwere mkparịta udo.
Na mba ofesi
Ebe foto si, EPA
Ihe ruru mmadụ iri na otu anwụọla na mba Amerịka n'ihi oke ifufe 'Florence' nakwa idemmiri nke n'akpa ike n'obodo Karolina.
Ebe foto si, Getty Images
N'otu aka ahụ oke ifufe akpọrọ Typhoon Mangkhut ataala isi mmadụ iri abụọ na otu na mba Philipines dịka otinyela isi na mba China.
N'egwuregwu
Ebe foto si, Getty Images
Otu Golden Eaglets nke Naịjirịa jiri penariti ọkpụ atọ asatara otu merie ndị Black Starlets nke Ghana n'asọmpi ikpeazụ WAFU.
Mmeri a bụ nke mere ha itozuoke n'asọmpi Iko mba Afrịka ndị n'okpuru afọ iri na asaa.
Nkeji ụtụtụ a
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa
Kofi Annan