TREM: Onye ọbụla gaa wulite Mpaghara ya - Bishọp Mike Okonkwo

Bishọp Mike Okonkwo Image copyright bishopmikeokonkwo/Facebook
Nkenke aha onyonyo Bishọp Mike Okonkwo bụbu onyeisi otu jikọtara ndị ụka ọgbara ọhụrụ na Naịjirịa bụ PFN n'ịchafụ

Onyeisiala ụlọụka TREM bụ Bishọp Mike Okonkwo ekwuola hoohaa na o kwenyeghi n'onye Igbo ịbụ onyeisiala kama ka onye ọbụla ga mezie mpaghara nke ya.

Bishọp Mike Okonkwo bụbu onyeisi otu jikọtara ndị ụka ọgbara ọhụrụ na Naịjirịa bụ PFN n'ịchafụ kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ ndị ntaakụkọ jụrụ ya ma o kwenyere na onye Igbo ịchị n'afọ 2023.

N'okwu ya "Abụ m onye Igbo, kama n'onwe m, ekwenyeghi m na ndị Igbo ịchọ ọkwa onyeisiala, ndị Igbo kwesiri imechi ụzọ ha ma wulite mpaghara ọwụwanyanwụ. Anyị na-achụso ihe ekwesighi ekwesi."

Bishọp Okonkwo gara n'ihu kwuo na ihe Naịjirịa chọrọ bụ nghazigharị obodo na ọbụghị onye Igbo ịbụ onyeisiala.

O kwuru " Dịka m nọ ugbua, ihe obodo a chọrọ bụ nghazigharị. Ihe mere onye ọbụla ji azọ onyeisiala bụ maka ihe ụtọ si n'ime ya apụta.

Nkenke aha onyonyo Ndị Eze n'ala Igbo

Ka onye ọbụla gaa na mpaghara ya ga wulite ya. Mee ka ọchịchị etiti gharazie ịdọ ndị mmadụ akpịrị ogologo. Kewaa ọchịchị etiti.

Ka ndị mmadụ lawa n'ebe ha, onwere ihe ọma i ji , ga mere ya ndị mpaghara gị, abụghị m onye na-achọ onye Igbo ịbụ onyeisiala."

Bishọp Okonkwo kwukwara na ọ bụ eziokwu na emegburu ndị Igbo mana ka ndị Igbo ejila nke ahụ akụnye aka n'ịzọ ọkwa onyeisiala.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: