Akachapụọla 'osu' n'obodo Ozalla

Ndị Igbo na-amachi Osu Image copyright PASO Ozalla/Facebook
Nkenke aha onyonyo Ụlọụka dị icheiche pụtara ị kwado ya bụ mmemme

Anya mmiri juru ndị gbakọrọ anya, ọṅụ eju ha obi ebe ha jịkọrọ aka kachapụ omenala ịkpaoke agbụrụ osu tinyere nkewa n'etiti ha na ụmụnwanne ha.

Otu kpọkọbara emume a bụ ngalaba akpọrọ PASO n'ịchafụ (PASO n'ahụ maka nkachapụ ihe ọbụla ga-ebute nkewa n'Ozalla) nakwa otu jịkọtara ụka Krịast n'Enugwu bụ CAN nakwa ndị na-achị obodo ahụ.

Onyeisi otu na-ahụ maka Oganiru Ozalla bụ Afam Ani kwuru etu obi si dị ya ụtọ, o kwuru na udo na ịdị n'otu dị mkpa maka na ụlọ kewara abụọ agaghị abara onwe ya uru.

N'okwu ya "Obi dị m ụtọ n'ihe a mere, o gosiri na udo alaghachitela ebe anyị nọ".

Reverend Joseph Ajujungwa, bụ onye odeakwụkwọ CAN n'Enugwu, gwara BBC n'ekwentị na ọ bụ Chineke kere mmadụ niile, na nkewa adịghị n'etiti osu na dịala n'iohu ya.

Ajujungwa sị: "mmadụ niile rikọrọ nrị, ṅụọ mmanya ma tee egwu iji gosi na ha bụ otu".

N'agbanyeghị na mmiri na-ezo n'ụbọchị ahụ igwe mmadụ si n'obodo ahụ pụtara ịkwado ya bụ emume e mere n'ọgbọ ụlọụka St. Pauls dị na 4 corners, Ozalla.

Ihe mere n'ụbọchị ahụ

Mmadụ niile n'obodo Ozalla gara n'ebe bụ obi ala ha, ndị okenye n'obodo were tinye iwu na onweghịzi onye bụ osu n'ime ha.

Na ụbọchị sọ ya, ndị ụka dị icheiche gara gozie ndị obodo ahụ iji gosi na ha kwadoro emume ha mere tupu mmadụ niile e rịkọ nri ọnụ.

Kedu onye a na-akpọ osu?

BBC Igbo gbara otu nwoke bụ Emmanuel Ihenacho ajụjụ gbasara ya, o kwuru sị "mgbe gboo, a na-achapụ onye bụ osu otu ntị ya, ka ndị mmadụ ji mara ya".

"Ihe ọzọ bụ na a na-ekenye ha ala n'isi ọdọahịa. A ka na-eme nke a ruo ugbua".

"Osu adịghịzị ugbua etu ọ dị na mbụ".

N'agbanyeghi na e tiri iwu iji kwụsị osu n'ala Igbo kamgbe afọ 1956, ụfọdụ ndị ka na-emegide ndị a na-ahụta dịka 'osu'.

Ọtụtụ oge ka a na-anapụ ha ikike ha nwere dịka mmadụ.

Etu e si emegide osu n'ala Igbo

  • Mgbe gboo, a na-eji ha achụ aja nye arụsị
  • Anaghị ekwe ha waa ọjị maọbụ gọọ ọfọ ọjị ọkachasị ma 'nwadịala' nọrọ ebe ahụ.
  • Ọtụtụ oge, anaghị ekwe ha lụọ nwaanyị bụ 'nwadịala'.
  • A na-akpaso ha oke agbụrụ site na mmekọrịta ha na ndị ọzọ.
  • Mgbe gboo, anaghị ekwe ha biri n'etiti ndị 'nwadịala'
  • Anaghị ekwe echi ha ọzọ maọbụ echichi ndi ọzọ.