South Afrịka: Nṅụwa nụ anwụrụike - Ụlọikpe

Akụkọ kachasị mkpa taa:

Ṅụwa nụ anwụrụ ike - Ụlọikpe Saụt Afrịka

Image copyright Getty Images

Ụlọikpe kachasị na mba Saụt Afrịka e nyela ndị tozuruoke ikike ka ha sewe anwụrụ ike na atụghị ụjọ ọbụla.

Mana gọọmenti mba Saụt Afrịka gbarụrụ ihu na ya bụ ikpe kwuo na anwụrụike a na-emerụ mmadụ ahụ.

Amnesty International akatọọla ọnwụ Nọọsụ

Image copyright Getty Images

Ụlọọrụ Amnesty International akatọọla ogbugbu ndị Boko Haram gburu onye Nọọsụ ndị Red Cross ha tọọrọ kamgbe ọnwa Maachị afọ 2018.

Diraktọ ụlọọrụ a na Naịjirịa bụ Osai Ojigho gwara gọọmenti ka ha gbaa mbọ zọpụta ndị ọrụ ahụike nakwa Leah Sheribu bụ ndị eji eji.

Ụlọikpe sị ka anwụchie Sịnetọ Uzodimma

Image copyright Uche Akolisa
Nkenke aha onyonyo Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile

Ụlọikpe dị n'Abuja e nyela ndị uweojii iwu ka ha nwụchie Sinetọ na-anọchi anya Imo West bụ Uzodinma Okpara.

Ụlọikpe a kwuru na ọ jụrụ ị bịa zara ọnụ ya maka ebubo inye akwụkwọ e ji a dọrọ ego bụ adịgboroja dị nde narị naịra abụọ.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Abalị a ga-abụ oke ọṅụ nye ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya dịka asọmpi Uefa Champịọn ga-amalite ọzọ.

Otu Intermilan ga-alọghchite n'asọmpị a ọzọ kamgbe afọ isii gara aga ha gbasọrọ ya.

Nkeji nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Isi kote ebu ọ gbaa ya

Ụlọomeiwu atụọla mmadụ abụọ bụ ndị otu Chukwudumeme Onwuamadike a ma dịka Evans, nga mkpụrụọka.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Chukwudumeme Onwuamadike a ma dịka Evans bụ onye a na-enyocha maka ntọ ndị ji ego na Naịjirịa

Ọkaiwu Oluwatoyin Taiwo tụrụ Kelvin Emenike Ukoh na Emeka Obasi nga afọ iri anọ na otu maka mpụ a.

Cheta na ụbọchị ole na ole gara aga, Evans gọrọla ụkwụ na aka ya sị na ọ bụghị onye ntọ.

Ntorobia akatọọla Buhari

Ndị ntorobia Ohaneze Ndigbo akatọọla Onyeisiala Muhammadu Buhari maka nhọpụta a họpụtara Yusuf Bichi dịka onyeisi ndị ọrụ nchekwa DSS.

Kingsley Dozie bụ onye ndu otu a depụtara akwụkwọ ozi kwuru na Buhari mere nhọpụta a site n'ịkpa oke agbụrụ.

Na mba ofesi,

Image copyright Getty Images

Mba Amerịka ekwuola na ha ga-ebutu ọnụọgụgụ ndị mbịarambịara na-abata n'obodo ha ruo puku iri atọ n'afọ 2019.

Cheta na ọnụọgụgụ nke afọ 2017 bụ puku iri ise ebe nke 2018 bụ puku iri anọ na ise.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Nwaafọ Nigeria bụ Leon Balogun, esoghi gbaa bọọlụ ka ndị otu ya bụ Brighton na Southampton ji ọkpụ goolu abụọ gbaa onye laba onye laba.

Gụọ nkeji taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile