Nwoke a a jiaka ya rụọ ebe a ga-eli ya, maka gịnị?

Ili a na-arụ arụ

Ị chetula ebe a ga-eli gị ma ị nwụọ? Dọkinta Antony Mwandulami bi na Njombe dị na Tanzania arụọla ili ya na nke ndị nwunye ya atọ, ebe ha ka dị ndụ.

Mwandulami bụ dibia mgbọrọgwụ kwuru na e bidoro ịrụ ili ahụ kamgbe afọ asatọ gara aga.

O kwuru na ọ chọrọ ime ihe e ji echeta ya ma ọ nwụchaa, ga-apụ iche n'ihe ndị obodo ha na-eme.

Ọ ga-ewe ego ruru nde naira 162 tupu arụcha ya bụ ili.

Nkenke aha onyonyo Ndị Tanzania katọrọ ili a eji nde naira 162 wee rụọ

Mgbe onye ntaakụkọ BBC bụ David Nkya gara na be ya, ọ chọputara na ili ahụ bụ ihe tụrụ ndị Tanzania n'anya ma bụrụkwa ebe Mwandulami bi ụgbụa ma ruo mgbe ọ ga-anwụ.

N'agbanyeghị na ndị obodo ya na-akatọ ego o ji rụọ ili a makana agụrụ na ụbịam dị na be ha, Mwandulami kwuru na ego ruru nde naira 162 adịghị ọtụtụ maka ịrụ ili ya.

Nkenke aha onyonyo Mwandulami sị na ọ chọrọ ka ndị be ha gbasie ozu ya ma ọ nwụọ

Ọ bụghị naanị ili ya na-agbọgwoju ndị mmadụ anya, ọ bụkwa arịrịọ ya ka a gbasie ozu ya ma ọ nwuọ.

Ndị mmadụ na-ajụ gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ nwụọ n'ọnọdụ agaghị e nwetali ozu ya, mbọ na ego niile o tinyere wee rụọ ili a, ọ ga-ala n'iyi?

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara