Anambra Flood: Nwaanyị amụọla ụmụ ejima n'ụlọ gbatagbata

Ụmụ ejima Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Idemmiri a achụpụla ndị mmadụ na be ha na steeti kariri anọ na Naịjirịa

Ka ndị mmadụ ọkachasi ndị bi na steeti dika Anambara so n'ebe idemmiri na-akpa mkpamkpa ugbua na-eche ka mmiri taa, ihe ọṅụ emeela.

Otu nwaanyị akpọrọ oriaku Obiora amụọla ụmụ ejima n'ụlọ ebe ndị gbatagbata kpọsara ndị idemmiri chụpụrụ n'Ogbaru dị n'Anambara steeti.

Nwaanyi a mụrụ ụmụ ejima a ụbọchị September 20, bụ onye obodo Umuezeoma.

Onyeisi okpuru ọchịchị Ogbaru bụ Arinzechukwu Awogu, kwuru na nwaanyị ahụ mụrụ ejima nwoke na nwaanyị.

O kwuru: "Ọ bụ eziokwu na otu nwaanyị mụrụ nwaanyị ebe a, gọọmentị akpọpụla ha n'ụlọ gbatagbata kpọga ha ụlọọgwụ maka ezigbo nleta."

Arinzechukwu kwukwara na o nwere nwata nwaanyị dị afọ itoolu nwụrụ maka ihe mberede idemmiri a.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIdemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha.

Gọọmentị Anambra ekwuola na ọ ga-eme ihe ọbụla o nwereike ime iji hụ na ha wetere ihe enyemaka a na-enye ndị idemmiri chụpụrụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara