Akụkọ dị mkpa taa: Enyimba agbawaala Rayon Sports anya
Akụkọ dị mkpa taa
Mmeri Enyimba n'asọmpi CAF
Ebe foto si, @EnyimbaFC
Enyimba FC nwetara ihe nrite dịka 'otu kachasị agba' na mpaghara Afrịka n'afọ 2003
Otu egwuregwu bọọlụ Enyimba ji ọkpụ goolu ise chara acha asatara otu (5-1) merie ndị Rayon Sports nke Rwanda n'asọmpi iko CAF confederation agbara taa.
Ndị nyere goolu gụnyere Stanley Dimgba, Ikouwem Udo, Sunday Adetunji, Joseph Osadiaye na Isiaka Oladuntoye.
A ga-emegharị ntuliaka Osun steeti
Ntuliaka na-aga n'ihu n'Osun state
Ụlọọrụ INEC ekwuputala na ntuliaka iji họpụta gọvanọ Osun Steeti e mere ụnyaahụ ezughi ezu n'ihi ọnụ ọgụgụ vootu ndị akagburu n'ụfọdụ ebe.
Joseph Adeola Fuwape bụ onye gụpụtara vootu a kwuru na aga-emegharị ntuliaka ahụ n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Seputemba.
Ndị ntọọrị akpara ike ọzọ
Ndị ohi oke osimiri bụ Pirates na bekee wakporo ụgbọmmiri ngwaahịa nke Swiss n'oke osimiri si Legọs gawa Portharcourt ụnyaahụ.
Ndị ohi a tọọrọ mmadụ iri na abụọ bụ ndị so ụgbọmmiri ahụ eme njem.
Ebe foto si, EPA
Ụgbọmmiri
Ngalaba na-ahụ maka mmekọ mba Switzerland na mba ndị ọzọ kwụrụ na ọ bụ ụlọọrụ obodo ha nwe ụgbọmmirị ahụ, ma sịkwa na ọnweghị onye be ha so na ndị aka ji.
Ụgbọmmiri a bu ihe oriri Bekee kpọrọ wheat site Pọt Hacọt na-aga Legọs.
Na mba ofesi,
Onyeisiala mba Iran bụ Hassan Rouhani akatọọla mba Amerịka maka mwakpo emere ndị agha n'obodo Avhaz.
Rouhani kwuru na ọ bụ Gulf steeti mba Amerịka na-akwado butere mwakpo a mana Amerịka agọrọla ụkwụ na aka ha.
Ebe foto si, Reuters/AFP
N'egwuregwu,
Anthony Joshua meriri Alexander Povetkin na ọkpọ ha pịara unyaahụ na ama egwuregwu Wembly nke dị na Briten.
Ebe foto si, Getty Images
Povetkin bịara asọmpị ahu ka ọ mara ka ọ ga-anapụ Joshua ọkwa ya dika onye tụụrụ ugo na ịpịa ọkpọ n'ụwa niile nke Bekee kpọrọ world heavyweaight title, mana Joshua pịatụrụ ya na agba nke asaa.
N'asọmpi Premier league, Chelsea enweghi ike merie ndị West Ham dịka onweghi ndị nyere onwe ha goolu.
Gee nkeji nke taa
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa
Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha.