Buhari ekwusiela ike na gọmenti ya kwadoro SDG

Buhari Image copyright @bashirahmad
Nkenke aha onyonyo Muhammadu Buhari gara Ọgbakọ UN

N'ụbọchi Tuzde ka onyeisiala Mohammadu Buhari kweghariri nkwa maka ịmezụ atụmatụ "sustainable development goal", akpọrọ SDG n'aha ịchafụ.

Mkpebị a dị n'akwụkwọ ozi Onyeisisla a dere maka nchete ya bụ nkwa ndị mbaụwa kwere maka mmepe uwa nile gba gburugburu ọkachasị ndị ogbenye ọnụ ntụ.

N'akwụkwọ ahụ nke odeakwụkwọ mgbasa ozi ya bụ Femi Adesina gụpụtara, Buhari sị na "dịka ncheta ụbọchị tata ejiri hibe atụmatụ a siri dịrị, ana m ekwesi nkwa ike na ịhụ maka ọganihụ, udo nakwa nchekwa nke ụwa ịhụ na-ọnweghị nwananyị, nwoke, agbọghọ maọbụ okoro a ga-ahapụ".

Okwukwara na dịka mba nwere uchu na mmepe obodo na "Naịjirịa ga-esonye ndị mbaụwa ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu nke gụnyere United Nations, ndị abụghị ndị ọrụ gọmenti kwụrụ onwe ha akpọrọ "NGOs" na aha ịchafụ nakwa ndị okpokpo akwụkwọ ndị ọzọ ịhụ na-emejuputara SDG".

Okwukwara na " ha kwenyesiri ike na amụma i si na gọmenti fere na gọmenti ọzọ nke Naịjirịa nakwa amụma ịwehachite akụ na ụba na ọganihu Naịjrịa."

Buhari sị na atụmatụ SDG nyere ohere ị me ka achụọ agụ na ụbịam ọsọ ọkpa erụala ma bụtekwa ọga n'iru tọrọ atọ.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a