Akụkọ dị mkpa taa: Ndị agha nnupuisi si Sịrịa na Ịraq bụ nsogbu anyị - Buhari

Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a

Ihe Buhari kwuru na United Nation

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola ọzọ na ọ bụ ndị agha nnupuisi gbara ọsọ na Syria, Iraq na Libya butere oke iyi ndụ egwu na mpaghara Lake Chad.

Buhari kwuru nke a ụnyaahụ n'ọgbakọ ndị United Nation na-eme na New York.

Nfanyeaka n'ụkwụ NLC

Otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa

Ebe foto si, Stringer

Otu jikọtara ndị ọrụ bụ "Nigerian Labour Congress" enyela ndị otu niile iwu ka ha malite abụbọọrụ n'ime abalị taa.

Otu a kwuru na nke a bụ iji dọ gọọmentị aka na ntị ka ha leba anya n'okwu banyere ụgwọ opekatampa nke ndị ọrụ.

Akụkọ si mba ọzọ

Agha nnupuisi na Mali

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ruru mmadụ iri na abụọ bụ ndị agbụrụ Taureg na Mali anwụrụ ụnyaahụ dịka ndị ji egbe wakpochara ha

Nke a bụ n'ihi ọgbaghara dị n'etiti ndị agbụrụ ahụ na ndị agha nnupuisi Jihad bụ nke tarala isi mmadụ narị abụọ kamgbe afọ a.

N'egwuregwu

Manchester United na Derby County

Ebe foto si, Getty Images

Otu egwu Derby County ji ọkpụ asatọ asatara asaa na penariti merie Manchester United n'asọmpi iko Carabao

Nke a pụtara na Manchester United akwakọrọla pụọ n'asọmpi ahụ.

Gee akụkọ ndi ebe a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri nke ụtụtụ a

Aha onyonyo,

Okporoụzọ ala Igbo