Uche anyị bụ na onye ọrụ Aisha Buharị emeghị ihe a sị na o mere - Nwanne ya

Aisha Buhari na onyeisiala Muhammadu Buhari Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Aisha Buhari na onyeisiala Muhammadu Buhari nọ New Yọk ugbua

Baban-Inna, bụ onye na-arụrụ nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari ọrụ dịka onye enyemaka nọzị n'aka ndị DSS maka ebubo na o ji ọnụdụ ya wee gwuo ndị mmadụ chamdum.

Na nkọwa Aisha Buhari n'ime akwụkwọ onye na ekwuchitere ya zipuru ụnyaahụ, Baban-Inna na-anapụ ndị mmadụ ego n'aha ya. Ego eboro Baban-Inna na ọ nara ndị mmadụ ruru ijiri naira iri abụọ na ise (25 billion), mana oriakụ Buhari kwuru na aka ya adịghị n'ihe a na-eme nwaamadị a.

Nyocha ndị uweoji sị na ha mere na be nwaamadị a chọpụtara na ọ bụ sọọsọ ego a na-akwụ ya dịka ụgwọ ọnwa dị n'akara ụlọakụ ya.

Faruk Baban-Inna, bụ nwanne nwaamadị a gwara BBC na agwa a abụghị ụdịrị ha jiri mara nwanne ha nwoke.

Faruk gara n'ihu kwuo na etu a okwu dị n'aka ndị DSS olilanya ha bụ na a ga-achọpụta na aka nwanne ha di ọcha. Okwukwara na nwunye nwanne ya agara ịhụ ya.

Sulaiman Haruna, bụ onyeisi mgbasa ozi Aisha Buhari kwuru na ọ bụ eziokwu na aka Buhari adịghị n'ihe nwoke a na agabịga, ma kwukwa na ọ bu onye ọrụ ha dere akwụkwọ gbara ama maka ihe a mere.

Dika ọ kwụ ugbua, Baban-Inna no n'aka ndị DSS, ka nchọpụta na-aga n'ihu.

Akụkọ ga-amasị gị