Osun Rerun: Ndị na-atụ vootu eboola ndị uweojii ebubo mmekpaahụ, aka ike

Ntugharị ntuliaka Osun steeti

Na agbanyeghị mmiri zoro n'ụtụtụ, ndị mmadụ pụtara n'igwe maka ntụgharị ntuliaka maka ọkwa gọvanọ n'Osun steeti.

E mere ntugharị ntuliaka n'ọnọdụ ịtụ vootu asaa dị n'okpuru ọchịchị Oshogbo,Olodo nakwa Ife-South na Ife-North, Osụn steeti n'ụbọchị.

Ndị na-atụ vootu na-ebo ndị uweojii ebubo mmekpaahụ, aka ike , ebe otu PDP na-ebo ebubo wuruwuru.

Cheta na Ademola Adeleke nker PDP nwetara vootu 254,698, ebe Gboyega Oyetola nke APC nwetara vootu 254, 345 na ntuliaka gọvanọ e mere na Satode gara aga, nke a mere ka Inec hibe mmegharị na ụfọdụ akụkụ steeti ahụ ebe ha kagbuburu vootu e mere n' ọnọdụ atụm vootu asaa.

PDP chọrọ ka agụgharịa vootu nke ụbọchị ụka

Nkenke aha onyonyo Dele Adeleke nke PDp ckwuru ka a gụgharịa vootu a tụburu ụbọchị ụka gara aga

Dịka a gbakọrọ ịgụ vootu atụkọtara na mmegharị ntuliaka Osun, otu onye nọchịtere otu PDP na Osun bụ Dele Adeleke kwuru ka a gụgharịa vootu a tụrụ na steeti ahụ ụbọchị ụka gara aga.

Adeleke kwuru na o nwere 'ihe akwụchaghị ọtọ' na ngụkọ e mere.

Mana onye ọrụ Inec nakwa ndị ọrụ pati ndị ọzọ jụrụ ajụ.

Onyeisi ọrụ Inec gwara PDp ka ha welie okwu ahụ elu ma ọ bụrụ n'ihe e mere adịghị ha mma.gawa

SDP, Omisore na APC

Ndị na-atụ vootu na-ebo ndị uweojii ebubo mmekpaahụ, aka ike .

Onyeisi otu pati Social Democratic Party (SDP) bụ Olu Falae ewezugala onwe ya na nkwado onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'Osun steeti n'okpuru pati ha nyere ndị APC.

Falae kwuru na ya na pati ya na-akwado pati PDP na ntuliaka a ga-emegharị taa na steeti ahụ.

Akụkọ na-ekwu na mkpebi Omisore ịkwado APC naanị otu ụbọchi tupu e megharịa ntuliaka n'ụfọdụ ebe na steeti ahụ sotere njem ndị APC mere na be ya.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOsun 2018: "Vootu gị bụ ike gị, ere na ya"

Ndị ahụ gara be ya nke onye ndu ha bụ onyeisi pati APC Adams Oshiomhole gụnyekwara ndị gọvanọ steeti ndị ọzọ na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na pati ahụ.

Mana Omisore kwuru na ya kpebiri ịkwado APC agbanyeghị na onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki gara be ya maka na APC kwetara ime ihe ya rịọrọ ha.

Cheta na ndị Inec kwuru na ntuliaka e mere n'Osun ụbọchị Sepụtemba 22 ezeughi ezu maka vootu ndị a kagburu akagbu.

Inec tinyere ụbọchị taa maka imegharị ntuliaka n'ebe ndị a kagburu vootu ha.

Na mbụ pati PDP bụ nke Adeleke nọ na ya zọọ nwtara vootu karịa ndị APC mana maka na vootu ndị akagburu akagbu ka ndịiche dị n'etiti vootu ndị PDP ji aga ndị APC, Inec kpebie na a ga-emegharị ntuliaka ahụ n'ebe ndị ahụ a kagburu akagbu.

Ụwa niile na-ele anya ịhụ ihe ga-eme taa na onye ga-apụtazi dịka onye mmeri taa maka na ebe asaa a ga-emegharị ntuliaka a taa, ga-ekwu onye ga-achị Osun steeti afọ anọ na-abịa.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a