World Bank: Anambra bụ ọkacha na mwulite obodo -
Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a:
Anambra bụ ndị mbụ
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọakụ mbaụwa bụ World Bank ekwuola na Anambara steeti bụ ndị mbụ n'ọrụ mwulite obodo n'afọ 2017 n'ime steeti dị mpaghara ọwụwanyanwụ nke ụlọakụ ahụ na-akwado.
Direktọ ụlọakụ a na Naịjirịa bụ Rachid Benmessaou kwuputara nke a n'ụlọ gọomenti Anamara Steeti dị n'Awka n'ụbọchi Tuusde gara aga.
Abụbọ ọrụ ndị NLC
Ebe foto si, STRINGER
Otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ NLC agbala isi akwara na ha ga-agba abụbọ ọrụ dịka mkparịtaụka ha na gọọmenti amịtaghị mkpụrụ ọbụla na ụbọchị Wenezde.
Onyeisi ndị otu a bụ Ayuba Wabba kwuru na gọọmenti ka na-adọla aka elekere azụ n'itinye ọnụ n'okwu ụgwọ opekatampe ndị ọrụ.
Akụkọ si mba Ofesi
Ebe foto si, Getty Images
Nzukọ Trump na Kim Jong-Un mere ya mbụ ndị isiala mba Amerịka na Nọt Koria ga-ezukọ
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ dịghị ya ọkụ ọkụ ime ka Nọt Korịa kpochapụ ngwaagha nuklịa ha kama na mmachi a machiri mba ahụ ka dị ire.
Trump kwuru nke a ụnyaahụ n'ọgbakọ otu United Nation nke na-aga n'ihu na New York.
N'egwuregwu
Ebe foto si, Getty Images
Chelsea si n'azụ were ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Liverpool iji gbapụ ha n'asọmpi Iko Carabao.
N'otu aka ahụ Leganes ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Barcelona ebe Sevilla ji ọkpụ goolu atọ chara acha merie Real Madrid n'asọmpi La Liga.
Nkeji nke ụtụtụ a:
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile
Lee ihe nkiri anyị
Iri ji: Ndi ike pụtara n'uju na mgba Igbuzo