Akụkọ kachasị mkpa na Toosde: Enyi azọgbuola nwanyi njem

Enyi azọgbuola nwaanyi na Zimbabwe

Image copyright Getty Images

N'ofesi, enyi azọgbuola otu nwanyị sị mba Germany gara njem n'ụlọanụ dị na Zimbabwe.

Akụkọ kwuru na otu enyi zọgburu nwaanyị a ebe o na-ese ha foto ebe ha gbakọrọ.

Obiano adọọla ndị ide mmiri nwakporo aka na ntị ọzọ

Image copyright Willie Obiano Facebook

Gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano adọọla ndị ka bi n'ebe ide mmiri wakporo ndị mmadụ ka ha si ebe ahụ pụọ ngwa ngwa tupu ọ kara ha njọ.

Obiano kwuru na ozi a adila ezigbo mkpa maka otu nwata nwaanyị ọzọ dị afọ itoolu nwuru n'ime ide mmiri a n´ụbọchị ole na ole garaaga.

NLC ebidoola abụbọ ọrụ na Naịjirịa

Image copyright Getty Images

Dịka ka otu jikọrọ ndị ọrụ na Naijirịa bụ NLC bidoro abụbọ ọrụ taa, ọtụtụ ụlọọrụ mechiri ụzọ ọrụ ha na steeti dị iche iche na Naịjirịa.

Mana o nwekwara ọtụtụ ebe ọrụ ka na-aga agbaneghị na NLC kpebiri na abụbọ ọrụ ga-ebido taa.

Andy Murrey agaala n'ihu n'asọmpi Shenzen

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, Andy Murrey abaala agba anọ nke ikpeazu ebe o meriri Scot Murray n'asọmpị tenis nke ha na-eme ugbua na Shenzen China.

N'aka ọzọ ọgba tennis Serena Williams ekwuola na ọ ghọtaghi ihe mere onye nchikọta ya bụ Patrick Mouratoglou kwuru na o nyere ya aka mgbe ọ na-asọmpi tennis nke Ikpeazu n'Amerika ebe Naomi Osaka meriri ya.

Gee akụkọ anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIdemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha.