Osun Decides: A ga m anara APC mmeri m n'ụlọikpe-Adeleke

Adeleke Image copyright ademolaadeleke_01
Nkenke aha onyonyo Adeleke gosiri na obi adighị ya etu esi nara ya mmeri ya

Ọ bụ eziokwu na ndị otu pati APC na-enwe aṅụrị maka mmeri ha na ntulaka Osun steeti mana Ademola Adeleke zọrọ n'aha otu PDP egosila iwe ya.

Adeleke kọwara na ntuliaka a nke meghariri ụbọchị September 27 bụ ịhe ndọchịgha aka nke ga-enweta ogbugbo n'oge na-eteghị aka.

O kwuru na PDP ga-eme ihe niile dabara n'iwu Naịjirịa iji wee nata mmeri ya a napụrụ ya n'ike.

Adeleke kwuru na APC e nwerela ike manye onwe ha na-ebe ndị Osun nọ site n'iji ndị agboro ị wakpo ndị mmadụ ma ndị ntaakụkọ.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ntuliaka

Otu jikọrọ ndị na`-agba mbọ maka ikike dịrị onye a kpọrọ 'Nigeria Civil Society Situation ROOM' na bekee akatọla ka ntuliaka ọkwa Gọvanọ emere n'Osun steeti unyaahụ bụ Tọọsde siri gaa.

Dịka Inec si kpọpụta, Gboyega Oyetola nke APC onye nwetara 255,505 ji vootu narị anọ n'ọma (482) meriri Ademola Adeleke nke PDP onye nwetara 255, 023.

Ha kwuru na e ji ndị uweojii na ịkpa ike tinye ndị na-atụ vootu ụjọ n'ahụ, ebe e nyere ụfọdụ kaadị rida egosghị aha ha ohere ịtụ vootu n'ụfọdụ ebe.

N'akwụkwọ mgbasaozi nke otu ahụ wepụtara n'abalị Tọọsde, ha kwuru ọnọdụ e jiri kagbuo ntuliaka emere na mmegharia bụ ihe mekwara ọzọ, ma na-ajụ ihe mere e ji kwuru na mpụtara mmegharị ntuliaka a.

Ha sị, " Dịka Situation Room siri hụta ya, o doro anya na ihe ndị mere e jiri kagbuo ntuliaka e mereburu na ọnọdụ itu vootu asaa ebe emeghariri ntuliaka nke gụnyere igba ike, mekwara ọzọ , nke a butere ajụjụ gịjnị mere ka ma kwụdo na mpụtara ntuluaka nke a."

Ha gara n'ihu kwuo na ka ihe siri ga gọsiri na ntuliaka ahụ emere na steeti ahụ akwụghị ọtọ, ma na-egosi atụm uche ka ntuliaka 2019 ga-adị.

Amerịka,Briten nakwa Yuropian Yuniọn katọkwara ntuliaka ahụ

Otu ndị akaebe ntuliaka sị Amerika, Yuropian Union nakwa Briten katọkwara ihe mere na Osun na Tọọsde.

Onye na-anọchite mba Amerịka na Naijiria bụ John Bray gwara ndị ntaakụkọ n'Oshogbo na abalị Tọọsde sị, : " Anyị hụrụ ọgbatauhie, mkpagbu ndị na-atụ vootu, ndị ọrụ pati, ndị ntaakụkọ nakwa ndị akaebe ntuliaka."

Ndị ntaakụkọ BBC nọ na-ebe emegara ntuliaka kwụkwara na ndị uweojii kpagburu ụfọdụ ndị pụtara ịtụ vootu nke mere ka egwu jide ụfọdụ.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia

Obi adịghị ụmụ Naijiria mma otu ihde siri gaa n' Osun.

Ụfọdụ na-ekwu na ọ na-egosi na ntuliaka 2019 agaghị akwụ ọtọ.

Mana ụfọdụ kwadoro etu ihe siri gaa.