Akụkọ kachasị n'abalị a: Obi agbawala otu D'Tigress

D'Tigress apụọla n'agba nke anọ

Image copyright Twitter/Fiba

Otu Amerika agbapụla otu D'Tigress nke ala Naịjirịa n'asọmpi bọọlụ nkata na-eme ugbua na mba Spain.

D'Tigres ruru agba nke anọ nke ikpeazu n'asọmpi a tupu agbapu ha.

Anya mmiri na etiti ndị agha ụgbọelu

Image copyright NAF

Ndị agha ụgbọelu Naịjirịa ekwuola na otu n'ime ha na-anya ụgbọelu anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu mere n'Abuja taa.

Nwoke a so na ndị na-anya ụgbọelu abụọ na-eme nkwadobe mmemme ịcheta ụbọchị demkraci nke ala Naijirịa nke afọ a.

Ụgbọelu abụọ a dara na Katampe n'Abuja.

Ọkụ agbaala ahịa na Portharcourt

N'Rivers steeti, otu ahịa mkpụrụ osisi agbaala ọkụ na D-Line n'ime Portharcourt.

Ndị hụrụ ihe mere gwara onye ntaakụkọ BBC na ha maghị ihe butere ọkụ a. Mana ha na-eche na ọ bụ ọkụ latrik kpanyere ọkụ ọgbụgba a.

Ihe ihere emela onye ụkọ chukwu

Image copyright Reuters

N'ofesi, Pope Francis bụ onyeisi ndị ụka kotolik eyipula otu fada aha ya bụ Fernando Karadima akwa maka ebubo mmekorita ahụ ya na ụmụaka.

Pope Francis kwuru na o mere mkpebi a maka ọdịmma ndị ụka katolik.

Gee nkeji anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEtu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya