Buhari Waec Certificate: Onyeisiala anatala asambodo ya

Image copyright Bayo Omoboriowo
Nkenke aha onyonyo Oteela ndị mmadụ na-ajụ maka asambodo Buhari

Onye Ose foto Buhari bụ Bayo Omoboriowo, wepụtara foto gosiri ka Buhari natara asambodo ọhụrụ ngalaba na-ahụ maka ule na West Afrịka bụ Waec nyere ya.

Nke bụ na Waec etinyela mmechi n'akụkọ banyere ma Buhari onwere asambodo etu o si kwuo na o nwere.

Buhari kwukwara sị na ọ bụ ya na Shehu Musa Yar'Adua nwụrụ anwụ gakọrọ otu ụlọakwụkwọ ma na praịmarị ma na sekọndrị ma sorokwa banye ọzụzụ ndị agha otu oge.

O kwuru na ya na Yar'Adua lere ule Waec n'afọ 1961.

Otu n'ime ọnụ na-ekwuchitere Buhari bụ Bashir Ahmed tinyere ihe nkiri gosiri ka Buhari na-anata asambodo ya ebe n'elu Twitter:

Abụbọ ọrụ ndị NLC:

Ụlọikpe amachiela otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress nakwa Trade Union Congress ime abụbọ ọrụ dịka ha chọrọ ime n'izu na-abịa.

Mana ndị NLC ekwuola ugbua na ha anatabeghi ozi ọbụla banyere ya, na ha ga-aga n'ihu.

Onye mabara na mmiri

Otu nwoke na-arụ n'ụlọntaakụkọ Radio Nigeria aha ya bụ Oladejo O.R, gburu onwe ya ka ọ makpuru na mmiri Third Mainland Bridge taa.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwoke wụbanyere n'akwa mmiri 3rd Mainland

Ndị ha na Oladejo so n'ụgbọala mgbe ihe a mere, gwara onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ na ha nọ na-akpa nkata tupu ọ gwa ha ka ha kwụsị ka ọ nyụọ mamịrị, mana kama ịnyụ mamịrị ọ maba na mmiri.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Etu otu nwoke si maba na mmiri na Third Mainland Bridge

Ndị agha Naịjirịa na Shiite

Ndị agha Naịjiria ekwuola na ha ṅomiri ihe Donald Trump bụ onyeisi mba Amerịka kwuru ka a hụta ndị na-atụ ndị agha okwute, dịka ndị bu egbe.

Ha gwara BBC na ọ bụ ya butere ha ji gbaa ndị otu Shiite tụrụ ha okwute ka ha na-eme ngagharịiwe egbe n'Abụja n'izu a.

Ha tinyere ihe nkiri na-egosi ka Trump na-ekwu okwu a n'elu akara Twitter ha:

N'egwuregwu,

Ụlọikpe dị na mba Denmark amaala onye gbabuuru Arsenal bọọlụ bụ Nicklas Bendtner ikpe ịga mkpọrọ ụbọchị iri ise maka ịkụ onye na-akwọ ụgbọala ihe.

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Bendtner (nọ n'aka ekpe) gbaara Arsenal bọọlụ site n'afọ 2005 ruo 2014

Onye ga-eweta ọkọrọtọ APC n'Imo steeti:

November 2 bụ ụbọchị ikpeazụ INEC wepụtara maka ịnye ha aha ndị ga-ebụ ọkọrọtọ ndị pati nịịle nọ na Naịjịrịa bụ ndị ga-anọchite anya ha na ndọrọndọrọ ọchịchị 2019 dịka gọvano maọbụ ndi ọmeiwu.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọgbaghara dara n'ụfọdụ ebe ndị emere ntụliaka imeụlọ APC

Ka ọ dị ugbua onwebeghị onye ma ihe November 2 ga-eweta n'APC Imo steeti dịka ihe siri kwuru.

Ikpe ka dị n'ụlọikpe na etiti Uche Nwosu na Hope Uzodinma maka onye ga-ebutere APC ọkọrọtọ gọvanọ n'Imo steeti.

Chetakwa n'ụlọikpe yighariri ụbọchị ya bụ Ikpe mgbe amaghị ama, dịka ndị otu Rochas Okorocha na-arịọ ụlọikpe ukwu n'Abuja nke Justice Ishaq bello nọ n'isi ya ka ha kagbuo mkpebi ọkaikpe Othman Musa nke si na ọ bụ Hope Uzodimma meriri ya bụ ntuliaka APC n'Imo steeti.

Nke meburu mbụ bụ na okwu onyeisioche pati nọ n'ọchịchị bụ All Progressives Congress (APC) bụ Adams Oshiomhole kwuru banyere ntuliaka imeụlọ ndị APC mere n'Imo steeti mere ka ọ bụrụ na isi niile ndị mmadụ nyara na ntuliaka imeụlọ nke mbụ bụ n'efu.

Oshiomhole gara n'ihu kwuo na akwukwo abụọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Imo na-ewogharị na soshal media abụghị eziokwu.

Okwu a pụtara na Uche Nwosu, bụ ọgọ aka na-achị Imo steeti Rochas Okorocha, na Hope Uzodimma, bu onye bụ Sineto na-anọchịte anya Orlu zone n'Ụlọ Omeiwu nke Naịjirịa enweghị mmeri dịka ndị nkwado ha kwuru ụnyaahụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption"O nweghi onye ọzọ ka Uche Nwosu mma" - Okorocha

Cheta na akwụkwọ ndị oke APC nke na-ekweghị na nwepụta Rochas wopụtara Uche Nwosu wepụtara akwụkwọ gosiri na Hope Uzodimma ji vootu 423,895 merie ntuliaka ahụ. Onye binyere aka na ya bụ akwụkwọ bụ onye isi ndị APC bịara nhazi ntuliaka a bụ Ahmed Gulak.

N'aka ọzọ, Onye ode akwụkwọ mgbasa ozi APC n'Imo bụ Jones Onwuasoanya gwara BBC Igbo na ọ bụ Uche Nwosu merịrị.

Ọ gakwara n'ihu zitere anyị akwụkwọ onye ode akwụkwọ ndị kọmiti a binyere aka. Akwụkwọ a gosiri na Uche Nwosu meriri.

Nke bụ na tupu Oshiomhole jiri kagbuo ntuliaka, mmadu abụọ no ka ndị a sị meriri dịka ndị ga-azọ vootu na afọ 2019 dịka gọvanọ n'okpuru APC n'Imo steeti.

Ọtụtụ mmadu ndị BBC gbara ajụju ọnụ kwuru na ihe mere ntuliaka jiri dị ọkụ n'Imo ha were kwuo na ọ bụ maka ọtụtụ mmadụ chọrọ ohere ịchị Imo.

N'ime ha, Hope Uzodimma bụ onye Orlu Zone, bụ ebe ọtụtụ ndi chiri Imo na mbụ si. Gọvanọ Okorocha bụkwa onye Orlu zone.

Uche Nwosu bụ onye Umuokwe, Eziama-Obaire n'okpuru ọchịchị Nkwerre, nke sokwa n'ebe akpọro Ọrlụ Senatorial Zone na Bekee. Nke mere ka ọtụtụ mmadu na-ekwu na ebe Okorocha bụ ọgọ ya nwoke, ọ pụtara na ọchịchi ya ga-abu ndọtị nke Okorocha, dika Bekee na-akpọ 'term' ọzọ Okorocha nakwa Orlu Zone.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe Okorocha ji wepụta Uche Nwosu

Eze Madumere bụ osote aka na-achị Imo, ma bụkwara otu n'ime ndị na-azọ ọkwa govanọ na steeti ahụ. Madumere bụ onye gburugburu Owere, bu ebe si na ọkwa rụru ha makana kemgbe ọchịchi onye kwuo uche ya nke mpaghara batara n'afọ 1999, ha enwebeghi nwa ha chịri steeti ahụ.

Atụmatụ ya ịzọ ọkwa gọvanọ so n'ihe tisara adụ na mma ya na Okorocha.

Madumere kwuru na ọbụghị makana ya ezughi ịchịta Imo mere Okorocha ejighi akwado ya.

Ndị ọzọ so zọọ ya bụ oche bụchakwa ndị metụtara Okorocha, dịka onye rụrụ ọrụ dịka onye odeakwụkwọ gọọmentị Imo steeti bụ George Etche na ogbo ya n'ọrụ gọọmentị Imo bu Jude Ejiogu.

Chima Anozie, Peter Gbuje, Chris Nzemoka na Chuks Ololo sokwa zọọ ya bụ ohere ịtụrụ ugo APC.

Ihe BBC Igbo hụrụ

BBC Igbo gara Imo steeti maka ntuliaka a, wee ga n'ime obodo dị icheiche n'ụbọchị Monde bụ nke mbụ n'ọnwa Ọktoba bụ oge a sị ntuliaka ga-ebido.

N'ọtụtụ ọdụ vootu n'ime obodo nakwa Owerri, BBC hụru ndị nọ n'aghịrị na-eche ka agụọ ha ọnụ. N'ụfọdụ, dịka na Umuchoke dị n'Amaigbo ebe BBC hụru ka agụrụ ndi bịara ịtụlịaka.

Akụko putakwara na Mbaitoli ebe agbara ụgbọala ndi otu ndọrọndọrọ ọchịchị Uche Nwosu ọkụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ụgbọala agbara ọkụ mgbe ọgbaghara a na-eme

Ka chi na-eji ụbọchị ntuliaka a, BBC Igbo gara Akwakuma ebe ndị mmadụ ka kwukwa n'aghịrị mana chi jiri ma emeghi ya bu ntuliaka, dịka onmye aka ebe no ebe ahụ.

Akụkọ na a na-eke ego karịrị. Akuko na ndị omekome bịara tisa ihe a na-eme kariri.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Akwakuma na-eche ka e wetere ha ngwo ngwo e ji atụ vootu

Nkagbu ntuliaka

Onwuasoanya mechara zitere BBC Igbo ozi na-akagbuola ya bụ ntuliaka, ma kwukwa na ọ bụ mgbe chi foro ka a ga-emeghari ya.

BBC Igbo gakwara ịhụ ma onwere ntuliaka ọzọ ga-eme mana sọsọ ndi uweojii no na ụfọdụ ebe a na-eme ntuliaka ahụ, dịka Ikenagbu Girls Sceondary School, Owere.

Ka ọ kwụ ugbua, Oshiomhole ekwuola na a ga-emegharị ntuliaka nke Imo. Etu ọ bụla o si dị, BBC Igbo ga-ano n'ọgbọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a