Akụkọ dị mkpa: Onye na-eyi ndụ egwu ekwesiri ịzọ ọkwa ọchịchị?
Akụkọ kachasị dị mkpa taa:
Na mba ofesi,
Ebe foto si, AFP
Gọọmentị mba somalia egbochiela otu onye bubu onye ndụ ndị otu Al-Shabbab bụ Mukhtar Robow n'ịzọ ọkwa onyeisiala na ala ha.
Ha kwuru na o nwebeghi ikike ị zọ ya bụ ọkwa n'agbanyeghị na ọ gọrọla isi ya n'otu Al-shabbab.
Na Naịjirịa
Okwu pụtara na ntụlịaka ọkwa Gọvanọ emere n'Osun steeti ebirila ọkụ ugbua
A na-anụ na ndị uweojii tụrụ anwụrụ anya mmiri na-ebe onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Saraki, Ben Bruce, Dino Melaye na ndị pdp ndị ọzọ na-eme ngagharị iwe n'Abuja taa.
Iwe ha bụ na emeghi ntụlịaka ahụ n'ụzọ kwụ ọtọ, ha boro INEC ebubo ịkwunyere otu APC na ntụlịaka ahụ.
Mana dịka ọ dị ugbua, INEC agọọla ebubo ahụ na-ekwu na o nweghi onye ha na ya jikọrọ aka ịzu votu maọbụ oche gọvanọ n'osun steeti.
N'Egwuregwu,
Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu football na mba Briten adaala manager Newcastle bụ Rafael Benitez nha ego ruru puku pounds iri isii.
Ha kwuru na ọ bụ maka na ọ dara iwu kwuru na ndị manager ekwesighi ịkwu uche ha gbasara onye ogbuopi tupu agbaa asọmpị ọbụla.
Gee Nkeji nke mgbede a:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
N'ụtụtụ
Uche Ogah ahọrọla Martin Azubuike ka Osote ya
Ebe foto si, Orji Kalu/twitter
Uche Ogah na Martin Azubuike
Onye ji ọkọrọtọ ndị APC maka ịzọ ọkwa gọvanọ Abia steeti bụ Uche Oga akpọpụtala Martin Azubuike dịka onye osote ya na steeti ahụ.
Azubuike bụbu onye omeiwu steeti ahụ si Isiala Ngwa so na ndị zọrọ inweta ikike ịnọchite APC.
Mmadụ 25 ọzọ anwụọla na Plateau steeti
Ọtụtụ mmadụ anwụọla na Plateau steeti kemgbe Jun 2018
A na-ekwu nke mere ọzọ emekwa: E gbuola mmadụ iri abụọ na ise (25) ọzọ na ọgbaaghara dị na Plateau steeti ụnyaahụ.
Onye kwuputara nke a bụ Sunday Abdu bụ onyeisi ndị Irigwe Development Associaltion bụkwara onye nnọchite anya ndị ogbe ahụ na ụlọomeiwu steeti ahụ oge gara aga.
US na Uk ebola Russia ebubo mpụ intanet
Ebe foto si, Getty Images
Trump na Putin
N'ofesi, mba Amerịka, Briten na Netherlands na-ebo Russia ebubo ime mpụ intanet a kpọrọ 'Cyber crime' na bekee.
Ụlọọrụ ikpe nkwumọtọ dị n'aka na mba US ekwuola na Russia ji mpụ intanet enyopu ụlọọrụ na-enyocha ngwaagha kemikal nke mbaụwa nakwa nke mba Amerịka.
N'egwuruegwu, Chelsea 1 - 0 MOL Vidi
Ebe foto si, Getty Images
Chelsea na MOL Vidi
N'egwuruegwu, na Europa league agbara ụnyahụ, Chelsea ji otu ọkpụ merie ndị MOL Vidi.
Akụkọ ga-amasị gị:
Imo state: Madumere bụ nwa m-Okorocha