Akụkọ kachasị n'abali a: Igbo achọghị osote onyeisiala - Ipob

IPOB etiila mkpu ọzọ

Image copyright AFP

Ipob ekwuola na ihe ha chọrọ abụghị ka onye Igbo bụrụ osote onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2019 dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu ugbua.

Ha kwuru na ndị na-ekwu ihe a bụ ndị ihere nye ndị Igbo. Ha kwusiri ike na sọsọ ịnwete ala Biafra bụ ihe kachasị ha mkpa.

Nnai Nwodo ekwuola ebumnuche Ohaneze gbasara ntuliaka 2019

Onyeisi Ohaneze ndi Igbo bụ Nnai Nwodo agwaala BBC Igbo na onweghị onye ha na-akwado ugbua maka ntuliaka 2019.

Mana o kwuru na onye Ohaneze Ndigbo ga-akwado ga-abụ onye kwenyere n'atumatu Bekee kpọrọ ''restructuring''.

Nikki Haley etinyela akwụkwọ arụkwaghị m

Image copyright Getty Images

N'ofesi, Nikki Haley bụ onye na-anọchịte anya mba Amerika na n'otu jikọtara ụwa akpọrọ ''United Nations'' etinyela akwụkwọ arụkwaghị m.

Haley banyere ọkwa a n'afọ garaaga ekwubeghị ihe mere o ji tinye akwụkwọ a.

Onyeisi ala Amerika bụ Donald Trump kwuru na ya ga họpụta onye ọzọ ga-anọchite ya anya n'ime izuka n'abia.

Senegal ga-anabata ụwa n'asọmpị Olympics ntorobia

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, ngalaba na-ahụ maka asọmpi olypics ahọpụtala mba Senegal dịka mba ebe ha-ago sọ mpi olympics nke ndị ntorobia nek afọ 2022.

Senegal bụ mba nke mbu sị mpaghara Afrika ga-anabata ụwa n'asọmpị a.

Gee nkeji nke abalị a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌ bụdị nkafie bụ ịkpere chukwu n'ụzọ omenala?

Nnia Nwodo gara iriji na Saụt Afrika

Nkenke aha onyonyo Nnia Nwodo malitere dịka onye ndụ nke itolu (9) ndị Ohaneze ndị Igbo na 2017

Ụnụ ejila ọgụ egbo ọgụ, bụ okwu Nnia Nwodo, onye ndu Ohaneze Ndigbo gwara Ndigbo.

Nwodo kwuru nke a n'olu onye nọchitere anya ya n'emume iri ji Ndigbo na Saụt-Afrika na nsonso a.

Ụbịam ọnụ ntụ abịala Alaigbo

Nkenke aha onyonyo Naịjirịa so na mba ụbịam ji aka na mba ụwa

Ụnụ anụla e, a gụnyela Ebonyi n'ebe ụbịam ọnụ ntụ kachasị na Naịjirịa.

Otu mbaụwa,United Nations Development Programme (UNDP) sị na ndị Ebonyi Sokoto, Jigawa, nakwa Rivas steeti bụ steeti ndị kacha daa ogbenye na Naịjirịa.

Donald Duke atọọla aka na nti maka Naijiria ịgba mbibi China

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Donlad Duke chiburu Cross River Steeti site na 1999 - 2007

Donald Duke bụ onye bu ọkọrọtọ ndị otu SDP na ntuliaka 2019 adọọla aka na ntị maka oke ụgwọ Naịjirịa na-ekonye onwe ya n'isi site mba China na mba ndị ọzọ.

Duke sị na ịgbazite ego na mba ofesi na egbu obodo a, nakwa na ọ ka mma ịhazị ụlọakụ Naịjirịa n'ụdị ga-enyere ha aka ibinye obodo ego na-agbaghị ọbara.

Super Eagles - Ọ ihe bụ ụkwụ nama ji eje Umuahia?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Super Eagles kwesiri ịmalite nkwado African Campionship n'izu a.

Obi na-amapụ ndị Nigeria Football Federation (NFF) ebe ọ bụ naanị mmadụ atọ ndị Super Eagles batarala maka nkwado asọmpị ha na ndị Libya ga-enwe na Uyo ụbọchị Satọde na-abịanụ.

Gee nkeji nke abalị a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌ bụdị nkafie bụ ịkpere chukwu n'ụzọ omenala?

Akụkọ ga-amasị gi

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a