Akụkọ kachasị na mgbede: Ndị IS gburu ndị agha Naịjirịa asaa - Ndị agha

Akụkọ dị mkpa taa

Mwakpo ndi Islamic State mere ndi agha Naịjirịa

Image copyright Getty Images

Ndị oyi egwu akpọrọ Islamic State nke Bekee ekwuola na ha gburu ndị agha Naịjirịa ruru iri atọ na otu ma nwuchie mmadụ isi na mwakpo ha mere na obodo Kangarwa dị na Borno.

Okwu pụtara na ozi ndị IS zipụrụ ụnyaahụ.

Ndị agha Naịjirịa kwuburu na ha na ndi omekome a kwara isi nwanne ụnyaahụ na Kangarwa na Arege, mana ha ekwughi maka ndị ometụtara.

Mana taa, ndị agha Naịjirịa dekwara na twitter na ọ bụ ndị otu asaa nwụrụ ka iri na isi merụrụ ahụ.

Ndị agha kwụkwara na ha nọ na usoro ime ka ndị nwe ndị a nwụrụ mata ihe mere ndị be ha nakw inye ndị merụrụ ahụ ọgwụgwo.

Gọọmentị ekwerela ịkwụ ndị ọrụ N24,000

Image copyright @LabourMinNG
Nkenke aha onyonyo Ngige so na Kọmiti na-ahụ maka ibuli ụgwọọnwa

Minister na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na agbanyeghị na gọọmentị etiti kpebiri ịkwụ ndị ọrụ ha opekatampe ụgwọ ọnwa puku naira iri abụo na anọ, nke steeti, puku naira iri abụọ nke, Ngalaba na-ahu maka ndi ọrụ bụ NLC chọrọ iri atọ.

Ọ si na akụkọ na ha ekwerela ịkwụ puku iri atọ abụghị eziokwu

Ihe Pope Francis kwuru maka ite ime

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo N'oge gara aga Pope Francis kwuru megide ịma mmadụ ikpe ọnwụ

Onyeisi ndị ụka Katọlik bụ Pope Francis ekwuola na ite ime dịka ịkwụ mmadụ ụgwọ ka ogbuoru gị mmadụ.

Okwu Francis a bụ nke kachasi sịe ike kemgbe o bidoro tinyenwe ọnụ n'ihe gbasara ite nwa.

Onye nchikọta ndị otu bọọlụ Libya agbaala arụkwaghịm

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Adel Amrouche sị na ya adị emezi

Onye nchikọta ndị asọmpị bọọlụ mba Libya akwakọrọla lawa n'ihu egwuregwu bọọlụ mba ahụ na nke Naịjirịa ga-agba maka ima onye ga-etozu oke iko mba Afrika nke afọ na abịa

Adel Amrouche bụ onye mba Belgium kwuru na ọ bụ mgbawa obi ọnọdụ ọrụ ya mere ya jiri kwakọrọ nawa

Gee Nkeji nke mgbede a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAPGA: Ndị Imo tunyere pati APGA na ntuliaka 2019

INEC emapụla APC na Zamfara iso mee ntuliaka 2019

Image copyright BBC/Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị mmadụ na ebo INEC ebubo amaghị eme maka mpụtara ndọrọndọrọ Osun steeti na ebe ndị ọzọ

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjịria a kpọrọ Inec amachiela APC na Zamfara Steeti ịwepụta ndị ga-azọ ọchịchị na steeti ahụ.

Inec sị mmiri ribidodoro APC Zamfara maka ịweta akwụkwọ ndị nọchite anya ha.

Buhari chọrọ ịgba mbibi ego ọzọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala Naijiria bú Muhammadu Buhari,chóó ízó ókwa onyeisiala na ntuliaka na-abía na Febúwarí 2019

Onyeisiala Muhammadu Buhari entinyela akwụkwọ ka ndị ụlọ omeiwu nye ya ikike ibitekwu ego ọzọ na mba ofesi.

Buhari na-arịọ ka ya bite ego karịrị ijeri dọla abụọ nke ọ ga etinye ụfọdụ n'ime n'ọrụ n'afọ a.

Stella Ogonna Okpaleke akwụọla ụdọ na Gana

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị igbo na azụ ahịa na Gana na ahusi anya kemgbe gọmenti obodo ahụ malietere ịhazigharị azụmagha obodo ahụ

Nwaanyị Igbo akwuọla ụdọ na Gana dịka e mechichara ahịa ebe ha na-azụ ahịa na mba ahụ.

Otu jikọrọ ndị Naijiria na azụ ahịa na Gana kwuru na Ọrịakụ Stella Ogonna Okpaleke, onye ji ụmụ atọ kwụrụ ụdọ ka emechịchara ọdọahịa ya na mba ahụ.

Ndị ụka asaala Lauretta Onochie

Nkenke aha onyonyo Igwurube mmadụ pụtara maka ngagharị iwe ahụ na steeti dị iche iche na Naịjirịa

Otu jikọtara ndị ụka Kristi niile bụ CAN azachiele ojeozi onyeisala Buharị na Soshal midia bụ Lauretta Onochie na ebubo o boro onyeisi ha bụ Samson Ayokunle.

CAN kpọrọ Lauretta 'efulefu' maka ibo onyeisi ha ebubo mpụ.

IMF adọọla Naịjirịa aka na ntị

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo IMF ụlọakụ mbinye ego mba ụwa

IMF adọọla Naịjirịa aka na ntị ka ha ghara ịkpụ ụkwụ n'ala maka ịhazịgharị akụnụba alla anyị dịka ọnụ mmanụ agbị na-arị ugbua.

N'aka ọzọ, Hillary Clinton akpọọla ndị pati democrats n'ụlọomeiwu Amerika ka ha nyocha agwa onyeisiala Donald Trump n'usoro ntuliaka 2016 na mba ahụ.

Ụwa a gbaa Black Stars gharị

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Black Stars dachiri azụ na ruo 51 na oche ndị FIFA

N'egwuruegwu, ka ọ dị ugbua, Gana amabeghị ka asọmpị ha ndị Sierelionu nwere ụbọchị Tọzde aga enwe isi.

Cheta na FIFA machiri Sierelionu maka gọọmenti ha ịtinye aka na ọchịchị egwu bọlụ mba ahụ.

Gee nkeji nke ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌ bụdị nkafie bụ ịkpere chukwu n'ụzọ omenala?

Akụkọ ga-amasị gi

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a