Igbu ichi: Ihe mere ndị Igbo ji egbu umunwoke apa n'ihu mgbe gboo

Igbu ichi: Ihe mere ndị Igbo ji egbu umunwoke apa n'ihu mgbe gboo

BBC gara emume ndi Umudioka mere n'Abuja iji mata ihe o ji bụrụ naanị ndị ji ihe na-egbu ichi na ala Igbo mgbe gboo.

Odika Chidolue bụ naanị onye gburu ichi dịka e si eme ya mgbe gboo ka dị ndụ n'Umudioka putara n'ọgbọ n'emume a.

Ọ gwara BBC na ya amatala ihe mgbe egburu ya ichi.

N'otu aka ahụ, Nze Eyisi Ebuluo nke abụọ sị na ọ bụ mgbe nwafọ Umudioka ruru ihe dịka afọ isii ka mma nka (mma eji egbu ichi) ga-eru ya ihu.

O kwukwara na onye ọbụla gburu ichi nwereike ị ga ebe ọbụla na-atụghị egwu ọbụla, maka onye ọbula hụru ya ga-ama na o bu oke mmadụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: