Ike Ekweremadu ekwụọla na mkpọpụ ya ụlọikpe gọmentị na-eme bụ amụosu

Ekweremadu Image copyright Getty Images

Nke mere ọhụru bụ na gọmentị etiti anatala ikike inye osote onyeisi ndị Omeiwu Naịjirịa bụ Ike Ekweremadu akwukwọ iku ikpe na ụlọ ọrụ ya nke dị n'Ụlọ Omeiwu ukwu n'Abuja.

Ụlọikpe ọkaikpe Ndị ọkaiwu Binta Nyako nọ n'isi ya nyere iwu ụnyaahụ bụ Wenesde ka enye onye nhazi nọ na Ụlọ Omeiwe Naịjirịa dị n'Abuja bụ Ekweremadu akwụkwọ iku ikpe.

Nke a pụtara ka Celsu Ukpong, bụ onye okaiwu gọọmentị, kwara akwa arịrị na ha ahụghị ihu maọbu azụ Ekweremadu iji nye ya akwụkwọ bụ isi okwu.

Cheta na gọọmenti kpụpụrụ Ekweremadu ụlọikpe makana ha si na okwuchaghị ka akụnaụba ya ha tupu ọ ṅụọ iyi oji bụru onye omeiwu.

BBC gbara Uche Anichukwu bụ onye ndụmọdụ Ekweremadu na ihe gbasara ntaakụko ajụjụ maka ihe a na-eme.

Mazi Anichukwu sị na agbanyeghi na onweghị ọtụtụ okwu ya nwereike ikwu maka okwu a makana ọ nọ n'ụlọikpe, uche ha bụ na ọ bụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị ka eji na-avọpụta ya bụ okwu.

Mana, ọkaiwu Ugo Egbujo gwara BBC na ya ahụghị mmekpa ahụ dị na okwu a.

Ọ sị na ya bụrụ na gọmenti hụrụ ihe yiri ya mpụ ebe ọbula, ha nwere ikike ịgba onye ha che na aka ya dị n'ime ya akwụkwọ n'ụlọikpe.

"Ihe enwereike iji agba mmadụ akwụkwọ n'ụlọikpe karịri.

Mana onye aka ya di ọcha enweghị obi mmapụ, tumadị maọbụrụ na-omegideghị ikike diri onye."

Ndị Omeiwu laghachitere ụlọ ọrụ ha ụbọchị Tuesde bụ ụbọchị nke iri nke ọnwa Ọktoba.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: