FGM: Mba UK enyela Afịrịka nde pounds 50 iji kwụsị FGM

fgm Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo a ga-eji ego a kwụsị ibi ugwu nwaanyị na Afirịka

United Kingdom ekwuola na ha ga-enye Afịrịka ego ruru nde pounds 50 iji wee kwụsị ibi ugwu nwaanyị na mpaghara Afịrịka ya bu ihe ka bụ ihe a na-ahụ anya.

Gọọmentị UK kwuru na ego a ha wepụterela bụ iji nye aka ịkwụsị ibi ugwu nwaanyi tupu afọ 2030 eruo.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIbi nwaanyị ugwu abụghị ezigbo omenala

Ibi ugwu nwaanyi gụnyere ị wepụ ọnụ ikpu, ebe ụfọdụ na-ahụta ya dịka ihe ha kwesiri ị me.

Ụlọọrụ ActionAid nabtara ihe UK mere maa kwuo na ị lebanye anya na naanị ibi ugwu nwaanyi "ezughị" ị kwụsị mwakpo ụmụnwaanyị.

Ibi ugwu nwaanyị megidere iwu ndị UK kamgbe afọ 1985 nakwa iwu e wepụtara n'afọ 2003 na 2005 nke megidere ị kpọpụ ndị Britein n'obodo ọzọ maka ibi ha ugwu.

Mana etinye beghị ya bụ iwu n'ọrụ.

Etu ọ dị ugbua, gọọmenti UK ekwuola na-enwere ihe ruru ụmụnwaanyị puku iri abụọ na anọ nwere ike ị danye n'ọdachị ibi ugwu na mba UK.

Ihe ndị ngalaba na abụghị nke gọọmentị na-eme maka FGM

Otu onye na-akwado ihe gbasara ịnye ụmụnwaanyị ikike dịrị ha bụ Chiamaka Uzomba ekwuola na ya ndị ụlọọrụ ya na-agba mbọ ị hụ na atụmaatụ ibi nwaanyị ugwu na Naịjịrịa ga-akwụsị

kpamkpam.

Uzomba kwuru na ha na-aga n'ime obodo gasị e nwe nkata gbasra ihe mere o ji dị njọ ibi ụmụnwaanyị ugwu n'ụwa kịta.

Uzomba kwuru na ha anaghị eji ike agwa ndị ntorobia ,ndị Eze, maọbụ ndị nwe obodo ha kwụsị ya bụ atụmaatụ mana ọ bụ nwayo nwayo ka ha ji eme ka ha kwụsị ya.

O kwukwara na ihe ndị ọzọ ha na-agba mbọ ya bụ ihụ nwaanyị gụrụ ezigbo akwụkwọ nwe nhataha na ebe ụmụwoke nọ ma chekwa onwe ha n'ihe gbasara nwakpo.

Uzomba kwuru na ha gaala n'ime Obodo kariri iri ị mee ka ha kwụsị ibi nwaanyị ugwu.

Gee ya nti ebe a.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụmụnwaanyị bidoro prịmarị n'Anambra steeti na 2014 dị 52,762 ebe ụmụnwoke dị 50,887

Onweghị mgbe ndị Igbo jiri kwụrụ na azụ agụm akwụkwọ na Naịjirịa.

Mana nchọpụta ndị National Bureau of Statistics (NBS) biputara bụ nke gosiri ka ezigbo ndụ sị kwụrụ na Naịjịrịa site n'afọ 2013 ruo 2018 gosiri na agụm akwụkwọ riri mperi na Naịjirịa gbaa gburugburu.

NLC: Anyị ekweghị na puku naira iri abụọ na anọ

Zamfara primaries: Anyị nwere ndi ga-azo ọchịchị - APC

N'ime ya, ọnụọgụ ụmụnwaanyị nọ na akwụkwọ prịmarị ruo sekondrị riri mperi karịa nke ụmụnwoke.

Ebee ọnụọgụ ndị nọ n'akwụkwọ daara n'alaIgbo nile, o ji ihe dịka 0.0669 daa na Abia steeeti, Anambra ji ihe dika 0,555 were ruo ala.

Ebonyi steeti n'onwe ya ji 0.505 were gbada, ebe Enugu ji 0.479 rịdaa, Imo jiri 0.0544 were gbada ala.

Ihe mgbagwoju anya bụ na, agbanyeghị na Abia na Anambra steeti nọ n'isi ndị na-eme nke ọma na WAEC afọ 2018, ọnụọgụ ndị banyere ụlọakwụkwọ ririmperi.

Abịazia n'ime ya ọnụọgụ ụmụnwoke karịa nke ụmụnwaayị.

Otu a ka ọ dị site afọ 2013 rue 2016 dịka ihe nchọpụta ndị NBS ebiputara n'afọ a si kwuo.

Mana ihe ọtụtụ mmadụ na-ebu n'obi bụ na ịchụ ego ọkụ ọkụ anaghị ekwe ụmụ Igbo gụọ akwụkwọ.

Ihe nchọpụta a kagburu ya.

Lee ka osi kwụrụ na ya bụ akwụkwọ nchọpụta.

N"Abia steeti, ọnụọgụ ụmụnwaanyị na-agụ akwụkwọ bụ pasenti 51.6 nke ọnụọgụ ụmụnwaanyị nịle nọ na steeti ahụ, ebe ụmụnwoke ha dị pasenti 63.3.

N'Anambra,ụmụnwaanyị dị pasenti 58.2 ebe ụmụnwoke dị pasenti 58.7.

Mana na 2014, ụmụnwaanyị ka ụmụnwoke bidoro prịmarị n'afọ ahụ.

Nke a pụtara na Anambra n'eme nkeọma maka na ihe ụmụwoke ji karịa ụmụnwaanyi erijughị afọ.

N'Ebonyi, ụmụnwaanyị dị pasenti 31.5 ebe ụmụnwoke 42.1.

Ụmụnwaanyị dị 45.9 n'Enugu ebe ụmụnwoke ha dị pasenti 53.2.

Ụmụnwaanyị Imo diri 56.1% ebe ụmụnwoke ha dị 64.9.

Ihe nke a pụtara na Ụmụnwaanyị ndị Anambra ka agụ akwụkwọ, ụmụnwaanyi Imo gbara ndị nke abụọ, ndị Abịa na-eso ha na-azụ dịka ndị nke atọ.

Ndị na-eso ha bụru Enugu na Ebonyi.

Onyeisi ndị Exam Ethic International bu Ike Onyechere tinyere ọnụ n'ihe mere agụm akwụkwọ ji adahachi azụ na Naịjirịa.

Onyechere kwuru na ọtụtụ ihe kpatara ya bụ ihe nke nọ n'isi ya bụ ọchịchị ọjọọ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a