APC na INEC ga-agwa ụlọikpe ihe mere ha ejighị nye Hope Uzodimma ọkọrọtọ ịzọ ọkwa gọvanọ n'Imo

Akụkọ dị mkpa taa

Image copyright HOPE UZODIMMA FACEBOOKPAGE
Nkenke aha onyonyo INEC kagburu ntuliaka imeụlọ mbụ ịwepụta onye ga-azọ oche gọvanọ emere n'Imo steeti

Ụlọikpeakpọkụọla APC na INEC

Ụlọikpe ụkwụ dị n'Abụja akpọkụọla APC na INEC ha bịa kwuo ihe ha agaghị eji nye Hope Uzodimma ọkọrọtọ dịka onye ga azọ ọkwa gọvanọ n'APC Imo Steeti.

Ụlọikpe a nyere APC na INEC mkpụrụ ụbọchị abụọ maka ịza oku a, maọbụ...

Obasanjo ọ gbagharala Atiku?

Image copyright @atiku

Akụkọ na ekwụ na onye bụ ọkọrọtọ PDP na ntuliaka 2019 bụ Atiku Abubakar na ọga ya Olusagun Obasanjo nwere nzụkọ mmechi ụzọ n'ehihie a.

Atiku na Obasanjo adịchaghị mma kemgbe ha hapụrụ ọchịchị na 2007 mana Obasanjo kwuru na ọgbagharala ya.

N'ofesi

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo N'afọ 2017, akpọpụtara Dewji dika ọkachasị nwe ego na Africa

A tọrola otu aka jiakụ nwa mba Tazania na ụlọ ọṅụṅụ na nkwarị dị an Dar es Salaam isiobodo mba ahụ.

Aka kpaara Mohammed Dewji n'isi ụtụtụ a mgbe ọ sị ịgbatị ọkpụkpụ pụta na hotel ya. Ndị uweojii ka na ama imi n'ala ịmata ndị kpara arụ a.

N'egwuruegwu,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Echiri ya echichi knight n'afọ 2012 maka obioma o na-egosi ndị mmadụ

Onyeisi oche Aston Villa bụ Sir Doug Ellis alakwurula ndị nna ya ochie mgbe ọ dị afọ iri itoolu na anọ (94).

Ellis sị na ọche eze dịka onyeisi oche Aston Villa ridaa n'afọ 2006. Ka mkpụrụ obi ya zuo ike na ndụkwa maọbụrụ na mkpụrụ obi na-ezuike n'ezie.

Gee Nkeji nke mgbede a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Lee ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEzinaụlọ: Onye kachasị emefu ego n'etiti di na nwunye?

Cristiano Ronald kana agọrọ isi ya

Image copyright Getty Images

Cristiano Ronaldo ka na-agọ ụkwụ na aka na onweghị mgbe ya kwasara Kathryn Mayorga iko n'ike n'afọ 2009.

Ọkaiwu Ronaldo na ekwusi ike na akwụkwọ nịịle eji ebo Ronaldo ebubo ahụ bụ nkonukọ ka ekonụkọrọ ha.

Gọmenti etiti akpụpụla Ekweremadu ụlọikpe

Image copyright @ike_Ekweremadu
Nkenke aha onyonyo Akpụkụrụ Ekweremadu ụlọikpe na o kwucheghị ka ọha mgbe ọ banyere ọchịchị

Gọmenti etiti akpụpụla osote onyeisi Sinete bụ Ike Ekweremadụ na onye nnọchite anya Akwa Ibom North East bụ Baseey Akpan ụlọikpe.

A na-ebo mmadụ abụọ a ebubo ha na ha ekwuchaghị ka ọ ha ha tupu ha bata n'ọchịchị.

Onye ọbụla nwere akụnaụba n'ofesi ga-akwụ ụtụisi

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Muhammadu Buhari na-ekwusi ike na ya na-anuso mpụ agha

Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyela aka n'akwụkwọ iwu ga-eme ka ihe taara onye Naịjirịa ọbụla nwere akụnaụba na mba ofesi akpụ.

Atụrụ anya na onye nwere akụnaụba dị otu a ga-ekwuputa ya na ihe akarịghị otu afọ ma kwụọ otuisi so ya. Onye ọbụla mere otu a ga-erite erere pụrụiche.

Hurrican Michael akpaala mkpamkpa n'US

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Hurrican Michael gbukwara ọtụtụ mmadụ n'ụzọ tupu abata mba Amerika

Ajọ ifufe akpọrọ Hurricane Michael ji oke ọsọ ruru kilomita narị abụọ abatala na Florida na mba Amerika.

Ka ọ dị ugbua, otu onye anwụọla na ya bụ oke ifufe bụ nke mebiri ọtụtụ akụnaụba ndị mmadụ.

Gee Nkeji nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Lee ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAPGA: Ndị Imo tunyere pati APGA na ntuliaka 2019

Akụkọ ga-amasị gị

NLC: Anyị ekweghị na puku naira iri abụọ na anọ

Zamfara primaries: Anyị nwere ndi ga-azo ọchịchị - APC

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a