Nigeria oldest prisoner: Nwoke dị afọ 100 a mara ikpe ọnwụ enwerela onwe ya.

Ụlọmkpọrọ Naịjirịa Image copyright Global Society for Anti-Corruption
Nkenke aha onyonyo Paul Egbunuche (nwa) na Celestine Egbunuche (Nna)

A tọghapụla Celestine Egbunuche bụ nwoke dị afọ otu narị a mara ikpe ọnwụ dịka gọọmentị steeti gbaghaara ya mmehie ya.

Nwoke a na-eche na ọ bụ onye mkpọrọ kachasị eme okenye anọọla n'ụlọmkpọrọ afọ iri na asatọ mgbe amara ikpe ịhazi ogbugbu mmadụ.

Dịka a tọhapụrụ ya, nwa ya nwaanyị bụ Chisom Celestine nakwa ndị ụlọọrụ Global Society for Anti Corruption bụ ndị gbara mbọ maka ntahapụ ya zutere n'ụlọmkpọrọ dị n'Enugwu.

"Ana m ekele Chineke n'ihi ụbọchị taa," nwa ya gwara BBC. "Abụ m onye kachasị enwe aṅụrị n'ụwa."

Egbunuche bụ onye ọrịa gụnyere ọrịa shuga nakwa anya na-arịa, nọ n'ụlọọgwụ ugbua mana a mabeghi ihe ga-abụ ọdịnihu ya.

Image copyright Global Society for Anti Corruption

Nwa ya nwaanyị sị na o onweghi ego ọ ga-eji lekọta ya na ọ bụ nwa ya nwoke Paul Egbunuche dị afọ 41 nọkwa n'ụlọmkpọrọ maka otu ebubo ahụ na-elekọta.

Ọ bụrụ ha si n'ụlọọgwụ a pụọ, ha enweghi ebe obibi dịka Franklin Ezeona, onyeisi ụlọọrụ GSAC, "Ọ bụ ihe ịmaaka n'ịhụ."

Gọọmentị gbaghara Egbunuche mmehie a pụọ n'ọchịchị, amaghị ma ha ga-enyere ya aka nakwa ụdị enyemaka ha ga-enye ya.

Image copyright Global Society for Anti Corruption

A mara nna na nwa a ikpe maka ịtọrọ ma gbukwaa mmadụ maka okwu ala ha na-azọ n'Imo steeti.

Paul ka na-ekwusi ike n'aka ha dị ọcha kemgbe e jidere ha n'afọ 2000 maa ha ikpe na 2014, tụba ha n'ụlọmkpọro ukwu dị n'Enugu bụzị ebe ha nọ na-esi igwe n'imi na-echezị mgbe ọnwụ ha.

BBC enweghị ike ịnweta ndị e gburu nwa ha maka ajụjụọnụ.

Ndị ụlọmkpọrọ sị na ha enweghị ike inweta ha.

Ked ka ahụ dị Celestine ugbua?

Paul gwara BBC na ahụ ezuchaghị nna ya oke.

"Ọ naghị echetekwa ihe nke ọma".

Ọ naghị amatacha ihe na-eme na gburugburu ya.

Paul sị na ọrụ ya ugbua bụ ịlekọta nna ya anya.

Nkenke aha onyonyo Ndị mkpọrọ na Naịjirịa

Ọ sịkwa na ndị ọrụ na-enye ya ọgwụ mgbe nile maka ọrịa shuga na ọrịa anya na-eme ya.

Okwu Celestine akpalitele okwu gbasara afọ ole ndị mmadụ na-anọ n'ime mkpọrọ mgbe amachara ha ikpe ọnwụ.

Akwụkwọ nchọpụta kwụrụ na ihe dị ka mmadụ 2000 ka amagoro ikpe onwu ma ha anwubeghị na obodo Naịjirịa.

Ikwugbu mmadụ na Naịjirịa abụghị ihe eji ike eme na Naịjirịa.

Image copyright Rochas Okorocha/twitter
Nkenke aha onyonyo Rochas Okorocha bụ gọvanọ Imo steeti 2011 - 2019

Site n'afọ 2007 ruo 2017 nanị mmadụ asaa ka akwugbugoro.

Nke ikpeazụ bụ n'afọ 2016 dịka Amnesty International si kwuo.

Ọkaikpe ukwu Imo steeti bụ Miletus Nlemedim kwuru na-edeela akwụkwọ ịrịọ gọmenti ka agbaghara ma nyekwa Celestine ohere ibi nwa ndụ ya nke fọrọ n'ụlọ ya.

Ọ sị na ndụ Celestine dịzị Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha n'aka, ibinye aka na ya bụ akwụkwọ ma ọmasị ya.

Akụkọ ga-amasị gi

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a