Akụkọ dị mkpa taa: Pope Francis eyipụla mmadụ abụọ uwe fada

Pope Francis ekpebiela maka fada abụọ

Image copyright Getty Images

Onyeisi ndị otu ụka katolik bụ Pope Francis eyipuola mmadụ abụọ sị mba Chile uwe fada maka ebubo nwakpo ụmụaka.

Pope Francis kwuru na ha ka na-enyocha ọtụtụ fada ndị ọzọ tinyere aka nudi emume a.

Buhari emeela mkpebi ọhụrụ

Image copyright Getty Images

Gọmenti etiti ekwuola na ha ebidoola ịnyocha ndị Naijiria bụ ndị ọnụ na-eru n'okwu ruru iri ise maka emume gbasara mpu na aghụghọ.

Ọ bụ onye mgbasa ozi gọọmenti a bụ Garba Shehu zipuru ozi a mana o nweghị aha ọbụla ọkpọrọ n'ime yabụ akwụkwọ ozi.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Onye bubu onye ọgba bọọlu otu Arsenal bụ Thierry Henry nke ayị na-akpọ Igwe abuola onye nchikọta otu bọọlụ n'obodo Monaco.

Henry binyere aka n'akwụkwọ kwuru na ọ ga-abụ onye nchịkọta ha ruo afọ 2021.

Gee nkeji nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ọkụ agbagbuola ụmụ mmadụ n'Abịa steeti

Image copyright Getty Images

Ọkụ si na okporo mmanụ agbagbuola ihe ruru mmadụ iri n'itoolu n'Abịa steeti mgbe ụfọdụ ndị ntorobia gara ohi mmanụ agbidi ebe ahụ.

Onye ọrụ ngalaba na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ NNPC akpọrọ Ndu Ughamadu kwuru na ya bụ ihe mberede mere n'ime obodo Umudaru.

Na ndọrọndọrọ

Image copyright AFP

Otu PDP ekwuola na ihe ha jị họrọ Peter Obi dịka onye ga-eso Atiku zọ ọkwa onyeisiala abụghị maka na o si na mpaghara ọwụwa anywanwụ

Ha kwuru na o zuru oke n'ihe niile a na-achọ n'ime onye ga-abụ osote onyeisiala.

Akụkọ Teknụzụ,

Image copyright Getty Images

Ọ bụrụ na ịnwere akara Facebook oge eruola iji gbanwe passwordu gị

Maka gịnị?

N'ihi na Facebook ekwuola na ndị na-eji ụzọ ezihi ezi abanye akara ndị mmadụ awakpoola akara ruru nde iri abụọ n'itoolu.

N'Egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Otu egwuregwu mba Libya ruru mmadụ iri ise atụọla n'Uyo dịka ha na akwado ịzute otu super eagles n'ụbọchị satọde.

Nzute ahụ ga-egosi onye tozuru ịga asọmpị Afrịca cup of Nations n'afọ 2019.