Obodo ọkụ gbara n'Abia steeti etiila mkpu ọzọ

Mmanụ ụgbọala na-ehi na Umuaduru ọzọ

Image copyright Getty Images

Ndị bi n'obodo Umuaduru n'Abia steeti etiila mkpu ọzọ makana mmanụ ụgbọala ebidokwa ihi n'ala.

Cheta na ọ bụ ụbọchị abụọ garaaga ka nnukwu ọkụ gbagburu ọtụtụ mmadụ n'obodo ahụ ebe a ga ịkuru mmanụ n'ehi n'ala.

Ndị uweojii kwuru na ha agawala ndị ụlọọrụ NNPC maka ịnyocha ebe a na-ehi.

Ntorobia Ohaneze Ndigbo na mba ụwa akwadoola Peter Obi

Image copyright Getty Images

Ndị ntorobia Ohaneze Ndigbo na mba ụwa na-ekele onye ji ọkọlọtọ PDP bụ Atiku Abubakar makana ọ họpụta Peter Obi dịka onye ga-eso ya n'ọsọ ntuliaka 2019 maka oche onyeisiala.

Otu a kwuru na nhazi ala Naijiria nke akpọrọ ''restructuring'' ka di ndị Igbo mkpa nakwa na a mara na Peter Obi ga-akwado ha na yabu ihe.

N'ofesi

Image copyright Getty Images

Ndị ụlọọrụ Red Cross nke mba ụwa na-arịọ gọọmentị Naịjirịa ka ha biko gba mbo hụ na ndị agha Boko Haram tọghapụ ndị otu ụlọọrụ ha abuọ ha torọ ka mgbe ọnwa Maach.

Red Cross na-arịọ Boko Haram ka ha mee ebere tọhapu ndị a makana a gburu onye ọzọ ha tọrọ n'ime ọnwa September.

N'egwuregwu

Image copyright AFP

Novak Djokovic bụ dike ugbua makana o meriela Borna Coric n'asọmpị tennis nke agba na Shanghai.

Mmeri a ga-eme ka Djokovic bụ v onye abụọ n'ime ndị kachasị agba tennis na mba ụwa.

Gee nkeji ugbua

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Archbishop nke Canterbury etinyela ọnụ na ntụlịaka 2019

Image copyright @mbuhari/twitter

Archbishọp nke Canterbury bu Justin Welby etinyela ọnụ n'okwu gbasara ntuliaka 2019.

Ọ gwara gọọmentị etiti ha mee ka ntụlịaka ahụ bụrụ nke kwụ ọtọ na-ekwu na nke a ga-ebute udo na ọganihụ n'ala Naịjirịa.

Ọ gwakwara ndị ụka Kraisti niile nọ na Naịjirịa ha jisike n'ekpere maka ọdịnma obodo.

Ihe a niile mere n'ọgbakọ akpọrọ "Interfaith initiative for peace".

Ọzọ

Nkenke aha onyonyo Akụkọ na-ekwubu na ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ adighị n'otu.

Obi adịghị ndị gọv PDP na ndị ndu pati ahu n' ọwụwa anywanwụ mma maka nhọrọ Atiku họrọ Peter Obi dịka osote ya.

Ha kwuru na ọ bụ maka na Atiku ajụghịha ase tupu ọ họrọ Obi, ebe ha chọbụrụ ka ọ bụrụ Charles Soludo, onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti(CBN).

N'Egwuregwu,

Image copyright AFP/Getty

A kpụpụla mmadụ asaa gụnyere onye bụbu minista egwuregwu na mba Kenya a kpọrọ Hassan Wario ụlọịkpe maka nrụrụaka.

E boro ha ebubo izuru ego enyere ndị egwuregwu iji kwado ma mee njem asọmpị Olimpiks n'afọ 2016.

Gee Nkeji nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee ihe ndị puruiche BBC hụrụ n'ala Igbuzo