APC eboola Obasanjo ebubo maka Atiku

Atiku Abubakar Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Atiku Abubakar bụ osote onyeisiala Naịjirịa na-etiti afọ 1999 nakwa 2007

Otu ndọrọndọrọ ọchịọchị All Progressives Congress eboola onye bubu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ebubo na ọ na-emagbasị mbọ ike ịhụ na mba Amerika nabatara Atiku Abubakar bụ onye ji ọkọlọtọ otu PDP.

N'ime akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchiri APC bụ Yekini Nabena zipuru ndị ntaakụkọ, o kwuru na Obasanjo chọrọ ka Amerika kabiri aha Atiku dịka onye ha dara iwu na agaghị enye ya akwụkwọ ikike ịbata n'ala Amerika.

Nabena dere na Naịjirịa kwesiri icheta na oge Atiku bụ osote onyeisiala, Obasanjo boro Atiku ebubo mpu na aghụghọ.

O kwukwara na Naịjirịa kwesiri ịcheta na ngalaba na-ahụ maka mpu, ohi na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crimes ka na-enyocha ebubo n'ishi Atiku maka ebubo ịnaka azụ ruru dọla puku nari ise.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a