Abia Gas Explosion: Ndị ọkụ gbagburu agbalitela

ọkụ ọgbụgba. Image copyright Getty Images

Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ọkụ gaasị gbara n'okporo mmanụ Osisioma dị n'Abịa steeti ụbọchị Friaide arịala ruo 150.

Onyeisioche ndị eze n'okpuru ọchịchị Osisioma bụ Eze Ikechukwu Chiavoghilefu, onye kwupụtara nke a oge Sinatọ na-anọchite mgaghara ahụ n'ụlọomeiwu bụ Sinatọ Theodore Orji gara njem nleta ịhụ ndị ihe a metụtara sịrị n'ọnụọgụgụ gbalitere dịka ọtụtụ e bugara ụlọọgwụ mechara nwụọ.

Chiavoghilefu sịrị, "Ihe dịka mmadụ 70 ndị e bugara n'ụlọọgwụ dị nso n'obi m n'ụbọchị mbụ ihe a mere anwụọla. Ndị nwụrụ anwụ akarịala 150."

N'okwu ya, Orji tụrụ arịrị na ihe butere ọdachi a bụ na ngalaba na-ahụ maka igwupụta na ire mmanụ na Naịjrịa bụ Nigeria National Petroleum Corporation, NNPC, anaghị elechi okporo mmanụ na-ehi nke kpata ọdachie.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara