Akụkọ kachasị taa: Lee nwoke ezinaụlọ tinyere ego n'isi ya iji zọpụta ya
Akụkọ dị mkpa taa
Na mba ofesi
Ebe foto si, Getty Images
Ezinaụlọ Mohammed Dewji bụ ọgaranya kachasị bụ nwata n'Afrịka etinyela ego n'isi ya iji zọpụta ya.
Ezinaụlọ Dewji bụ ndị Tanzania kwere nkwa ego ruru dọlla puku narị anọ na iri anọ a ga-enye onyebụla nyere aka iji chọta ebe ọ nọ.
N'ala Igbo
IPOB: Ụmụ ntorobia a agaghị atụ vootu na 2019- Ugochukwu Uko
Elliot Ugochukwu-Uko bụ onye ndụ otu ntorobịa ndi Igbo akpọrọ IYM n'aha ịchafụ ekwuola na otu IPOB agaghị atụ votu na ntuliaka 2019.
O kwuru na ọ bụ n'ihi mkpagbu ndị ọchịchị dị ịcheiche n'ala Igbo na-akapgbu ha.
Ọzọ,
Ebe foto si, Orji Uzo Kalu/Facebook
Orji Uzor Kalu bụ aka chịburu Abia Steeti ekwuola na onweghi okwu banyere akụkọ na-ekwu na aha ya so na ndị a machiri ime njem na mba ofesi.
N'ajụjụ BBC Igbo gbara ya, O kwuru na onweghi ihe nke ahụ pụtara ya mere na ọ gaghị aza ajụjụ banyere ya.
N'egwuregwu,
Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na mba Briten akatọọla omume ndị nkwado England na-eme n'obodo Seville dịka Spain na England na-akwado ịzute onwe ha n'asọmpị UEFA Nations League na mgbede a.
Gee Nkeji nke mgbede a:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
N'ụtụtụ
Gọọmenti etiti agọrọla ụkwụ na aka ha
Ebe foto si, Getty Images
Onye enyemaka pụrụ iche nke onyeisiala na mgbasa ozi bụ Garba Shehu ekwuola na onweghi aha ndị ha wepụtara dịka ndị gọọmenti machiri ime njem mba ofesi.
Ọsịsa a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ gọọmenti etitti maka ikwu na onwere aha ndị amachiri ime njem.
Mana n'abali ụbọchịụka, ojeozi mgbasaozi Buhari bụ Garba Shehu gọrọ sị na iwu Executive Order 6 nke machiri ụfọdụ ị ga njem si n'aka ọchịchị chịburu tupu ha banye.
Ọkụ mmanụ gaasị n'Abia steeti
Ebe foto si, Getty Images
Ndị eze nọ na mpaghara Abịa steeti ebe ọkụ mmanụ gaasị gbara ekwuola na ọdachi ahụ eriela isi mmaddụ karịrị otu narị na iri ise.
Onyeisioche ndị Eze nọ n'ọkpuru ọchịchị Osisioma bụ Eze Ikechukwu Chiavoghilefu kwuru na ọnụọgụgụ gbalitere dịka ọtụtụ ndị nọ n'ụlọọgwụ mechara nwụọ.
N'ofesi
Ebe foto si, Getty Images
Otu United Nation na-adọ aka na ntị na oge na-adịghị anya na agụrụ ga-anyụ ndị mba Yemen ịkpakwụ ma ọ bụrụ ma ọgụ gaa n'ihu na mba ahụ
Onye nchịkọta ọrụ United Nation nọ na Yemen bụ Lise Grande kwuru na ọnọdụ Yemen bụ ihe ihere nye mba ụwa niile.
N'egwuregwu
Ebe foto si, Brighton and Hove Albion
Onye nkọwapụta egwuregwu bọọlụ akpọrọ commentator na bekee bụ Peter Brackley anwụọla dịka ọgbara afọ iri isii na asaa mgbe ọ rịachara obere ọrịa.
Brackley bidoro ọrụ ya n'ụlọọrụ BBC Radio dị na Brighton tupu ọ gafe na ngalaba TV.
Gee nkeji ugbua
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
Lee ihe ndị puruiche BBC hụrụ n'ala Igbuzo