Osisioma Pipeline explosion: Mkpu ka na-ada n'obodo

Osisioma
Nkenke aha onyonyo Ọ bụ ndị gara iku mmanụ ụgbọala ka ọku gbara

Ụlọomeiwu ukwu Naijiria enyela iwu ka ebido nyocha ihe mere na n'Osisioma Abia steeti, ebe ọkụ gbagburu ihe karịrị mmadụ 150.

Sinetọ na-anochite mpaghara ahụ bụ Theoodre Orji onye welitere okwu ahụ n'ọgbakọ ha n'ụlọomewu sineti ụbọchị Wenezde, rụrụ ụlọọrụ NNPC aka n'ọdachi ahụ.

Sinetọ ndị Igbo tụnyere ọnụ gụnyere Victor Umeh na Mao Ohuabunwa.

Ha kwuru na ọ bụ maka NNPC na DPR ndị ọ dịrị hapụrụ ọrụ idozi okporo mmanụ ahụ oge ọ gbapuru na agbanyeghị na e wetara ha ozi mere ka ọdachi ahụ mee.

Akwa arịrị na-ari onwe ya elu n'obodo Ụmụduru na Ụmụimo dị n'okpuru ọchịchị Osisioma, n'Abia steetị ugbua n'ihi na ihe karịrị mmadụ ole na ole nara n'iyi na ọkụ.

Ya bụ ọkụ kpara mkpamkpa ahụ na ụbọchị Fraịde gara aga, oge ọkụ bara okporo igwe na-ebụ mmanụ agbịdị.

Nkenke aha onyonyo Ebe ụzọ mmanụ agbidi si ga.

Mgbe BBC rutere na Umuduru ebe ndị nwụrụ anwụ ka n'ọnụ ọgụ, ọtụtụ ndị anyị gbara ajụjụ ọnụ kwara arịrị na otela ha jiri na-agwa ụmụ ha wepụ aka enwe n'ofe tupu ọghọọ aka mmadụ.

Dịka ndị gọọmenti siri bupusịa ozu ndị nwụrụ anwụ, ọtụtụ ngwongwo ha ji amị mmanụ ka tọgbọrọ ebe ahụ.

Obodo nke abụọ ya bụ okporo Igwe mmanụ ghọrọ ọkụ bụ, Umuimo.

N'Umuimo, ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ gbara ọkụ.

Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ụlọ nara iyi n'ọkụ a gbara

Otu nwoke ụlọ ya gbara ọkụ bụ Chuks benson Uzoije kwara arịrị na mmadụ atọ nọ n'ụlọ ya ka ọkụ gbagburu ụbọchị ahụ.

Ndị ahụ ọkụ gbara bụ di na nwunye na otu nwa aghọghọ bi n'ụlọ ya.

O kwuru na kamgbe Fraịde izuụka gara aga ọkụ a gbara na ya na arahụ n'ụlọ onye ọzọ, ma yirikwa nanị otu akwa.

Nkenke aha onyonyo Ọba ndi mmadu ji ga iku mmanụ ụgbọala

Ụmụ nne ya bụ nwoke ndị nwanyị mmadụ atọ siri Legọs nakwa Calabar ebe ha na di ha bi were bịa ịhụrụ ụlọ nna ha juputara na anya mmiri n' ụlọ nna ha adịghịzịkwa.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a