Abia fuel explosion: Di na nwunye ọkụ gbara anwụọla

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAbia fuel explosion: Di na Nwunye bi n'ụlọ m rere ọkụ

Kọmishọna na-ahụ maka ahuike na Abia steeti bụ John Ahukannah a gwaala BBC Igbo na ọ bụghị ezioikwu na mmadụ iri abụọ nwuru na ụlọọgwụ Absuth.

Okwuru na onye ọ bụla na-atụ ụdịrị asị ahụ achọghị ọ dịmma Abia steeti.

Ahukannah kwuru na mgbe ihe mechara, na gọọmentị Abia gagharirị gụkọ ọnụ ndị niile metutara ma gwa ndị na-ezo ezo ha bia ka-agwọ ha.

O kwukwara na ọ bụ naanị mmadụ anọ ka ebugara n'Absuth mana etu ọkụ si gba ha mere ha ji n'ọrọ n'etiti ọ dịndụ ọnwụ ka mma.

Image copyright Njoku Chidiebere
Nkenke aha onyonyo Ihe ruru mmadụ 200 nwụrụ na ọkụ a gbara na Osisioma

Kọmishọna na-ahụ maka mgbasi ozi na steeti ahụ bụ John Okiyi jikwa ohere ahụ yọọ ndị mmadụ ha ejila ọnwụ maọbụ ihe mberede wee na-eme ndọrọndọrọ ọchịchị.

Okiyi kwuru ruo ugba, gọọmentị Abia steeti achọpụtabeghị ihe kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ.

O kwuru na ha na-eme nyocha ị chọpụta ya.

Cheta na Chidiebere Njoku kwuru na ndị niile ọkụ gbara n'ihe mberede osisioma ebutere n'ụlọọgwụ (Abia state university teaching hospital) nwụrụ.

Njoku kwuru na ihe kpatara ọnwụ mberede a n'ụlọọgwụ a bụ maka na e nweghị ọkụ latrik mgbe ya gara ịleta ndị ọkụ a gbara.

O kwukwara na ha nweghị ndị ọrụ ahụịke zuru oke n'ụlọọgwụ ahụ nke mere na ndị ọrụ ahuike na-akpọta ndị be ha ka ha bia nyere ha aka.

Image copyright Njoku Chidiebere
Nkenke aha onyonyo Ụlọgwụ a bụ nke gọọmentị Abia steeti na-elekọta

N'okwu ya, "ụbọchị Satọde m kpọrọ Samuel Nwaokonko na Chamberlain Adiaso wee gaa ebe ahụ hụ na ọ bụ naanị otu nọsụ na-elekọta mmadụ anọ ọkụ gbatọrọ."

Njoku kwuru na ajụjụ ọ na-ajụ bụ kedụ uru kọmishọna na-ahụ maka ahụike bara?

Ọ na-ajụkwa ọ na ọ bụghị ụlọọgwụ gọọmentị bụ ihe a?

Ka ọ dị ugbua, Njoku kwuru na di na nwunye ọkụ gbara na ya bụ ihe mberede anwụọla. A ga-eli ha na be ha bụ Isuochi.

O kwuru na ihe karịrị mmadụ iri abụọ anwụọla n'ụlọgwụ a kemgbe ụbọchị Fraide Ọctober 12 ihe mberede a mechara.

Njoku na-ekwusi ike na ọ bụ gọọmentị gbutọpụrụ ndị a.

Njoku na-azọ oche nnọchite anya ndị Osisioma Ngwa North dị n'Abia steeti n'ụlọomeiwu nke steeti.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara