Biafra ka anyị mkpa karịa nchutu Buhari - IPOB gwara Kayode

Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a:

Ndị na-achọ nnwereonwe Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Ọkaiwu Nnamdi Kanu, onye ndu Ipob bụ Aloy Ejimakor ekwuola na onweghi mgbe Kanu na onye bụbu minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Fani Kayode ji kwekọrịta iwepụ Buhari n'ọchịchị.

O kwuru na mkparịta ụka ha abụọ n'ekwentị bụ naanị ozi ekele na onweghi ihe ọzọ ha kwuru banyere ọchịchị.

Cheta na Kayode site n'akara Facebook ya dere na ya na Kanu ga-agbakọ aka ọnụ iji chutuo onyeisiala Buhari n'ọkwa ọchịchị.

n'aka nke ọzọ, mpụtagharị ihe Nnamdi Kanu ebutele oke arụmụka n'etiti ndị mmadụ na Naịjirịa karịsịa na mpaghara ọwụwanyanwụ.

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ ihe obi ụtọ nye ha ebe ndị ọzọ sị na ọ ga-emebi usoro ntuliaka afọ 2019. A na-anụ kepukepu na Kanu ga-ekwu okwu n'igwe Redio Biafra n'elekere isii nke abalị taa.

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla ogbugbu igwe mmadụ n'obodo Kasuwan Magani nke Kaduna Steeti ma kwuo na ị dị n'otu bụ ihe dị ezigbo mkpa.

Ọgbaghara a nke dapụtara n'etịtị ndị ntoroọbịa ụka Kraịst na nke Alakụba tara ihe ruru isi mmmadụ iri ise na ise.

Na mba ofesi

Ebe foto si, EPA

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola ha ga-ewezuga onwe ha na nkwekọrịta dị n'etiti ha na mba Rọshịa banyere nwaagha nuklịa.

Trump kwuru na Roshịa adaala iwu na-echekwa nkwọrịta a, bụ nke mba abụọ ndị a mere n'afọ 1987.

Rọshịa agọnarịla ebubo a ma kwuo na Amerịka na-eme nke iji kpachikọọ ikike na mba ụwa niile.

N'egwuregwu:

Ebe foto si, Getty Images

Otu egwuregwu bọọlụ Barcelona ekwuola na onye nke ha bụ Lionel Messi agaghị agba bọọlụ site ugbua rue izuụka atọ na-abịa site n'aka ọgbajiri mgbe ha na otu Sevilla zutere n'abalị ụnyaahụ.

Messi nyere ọtụ ọkpụ goolu tupu ọdachi a abịara ya.

Nkeji nke ụtụtụ a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri:

Aha onyonyo,

Gala boy: E kerem ndị mkpọrọ gala m na-ere maka na anọtụalam ọnọdụ ahụ