2019 Election: Zigara INEC aha Uche Nwosu - Okorocha
Akụkọ ndị dị mkpa taa
Zigara INEC aha Uche Nwosu - Okorocha
Ebe foto si, BBC Igbo
Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo
Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha agwala onyeisioche Pati APC bụ Adams Oshiomle ka o zigara INEC aha ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu dịka onye ga-eji aha pati ahụ azọ ọkwa gọvanọ n'afọ 2019.
Okorocha kwuru na ọ bụ naanị nke a ga-egosi ugwu Oshiomole nwere dịka onye ama ama n'ime udo.
Google echetala dọkịta Stella Adadevoh
Ebe foto si, Google
Ụlọọrụ Google echetela dọkịta Stella Adedevoh bụ onye nwụrụ dịka ọ na agba mbọ igbochi ọrịa Ebola ifesasị n'ala Naịjirịa n'afọ 2014.
Taa bụ ncheta ọmụmụ Adadevoh gbara n'afọ iri isii na abụọ.
Aka a kparala ndị mmadụ na Kaduna Steeti
Ebe foto si, @GovKaduna
Gọọmentị Kaduna Steeti ekwuola na aka a kparala mmadụ iri atọ na abụọ aka ha dị n'ọgbaghara na-eme n'ụfọdụ mpaghara steeti ahụ
Onye enyemaka ukwu pụrụiche nke gọvanọ ha na mgbasa ozi bụ Samuel Aruwan kwuru na a ga-ekpe ndị a ikpe ma taa ha ahụhụ dị n'ime ya.
N'ofesi
Ebe foto si, Google
Otu nwoke bu egbe awakpoola ụlọ nzukọ dị na Pittsburgh, Pennsylvania bụ ebe ọ malitere ịgba ndị mmadụ egbe dịka ha na-efe ofufe.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii sị na nwoke ahụ merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ tupu ọ wụsa ngwa egbe ya ma chilie aka elu.
N'egwuregwu
Ebe foto si, Getty Images
N'asọmpi Premier League Liverpool ewerela ọkpụ goolu anọ asatara otu merie ndị Cardiff, ebe Bournemouth gbara Fulham ọkpụ atọ chara acha,
Watford ji ọkpụ atọ gbanyụọ ndị Huddersfield, dịka Brighton meriri Wolves n'otu ọkpụ.
Ndị Igbo asaala Fashola maka ọchịchị 2023
Ebe foto si, Nwigwe/Fashola Facebook Page
Nwigwe kwuru na okwu a gosiri na ndị Yoruba chọrọ ị nara ndị Igbo oke ha
Ndọrọndorọ gbasara onye ga-enweta oche onyeisala ka na-aga n'ihu dịka minista na-ahụ maka ọkụ Latrik na ụlọ kwuchara na ndị Yoruba ga-eneta oche onyeisiala maọbụrụ na ha tunyere Muhammadu
Buhari na ntuliaka 2019.
Onyeisi Ohaneze ndị Igbo na Lagos steeti bụ Nnamdi Nwigwe a.k.a Odejimjim ekwuola na ọ bụrụ na enye ndị Igbo ọchịchị onyeisiala n'afọ 2023, Naịjịrịa ga-adịmma ọzọ.
Okwuru na okwu Fashola gosiri na ndị na-achị Naịjirịa ugbua chọrọ i me ndị Igbo ohu ruo mgbe ebi ebi makana na ha ma na asị ka ewebe oke, ọ bụ ndị Igbo ka ọchịchị ruru n'afọ 2023.
Nwigwe kwuru na ọ bụ maka udiri aghụghọ na-akpasu otu dịka IPOB i gosi iwe ha maka mkpagbu a an-akpagbu ụmụ Igbo na Naịjirịa.
N'ọnụ okwu ya, "anyị agaghị eji okwu Fashola gwu egwu makana o gosiri adịghị n'otu ndị ọchịchị ugbua.
Mana ụfọdụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo agwaala ndị yoruba ha chefuo maka ịnweta ọkwa ahụ n'afọ 2023 makana ọ bụ nke ha ebe ụfọdụ ndị Igbo achọghị ọkwa onyeisiala.
Ụlọọrụ NNPC etiela mkpu maka mwakpo
Ebe foto si, AFP
Ụlọ osisi mmanụ nke Naijiria anaghị arụ ọrụ dịka okwesiri
Onyeisi ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Corporation akpọrọ NNPC bụ Ndu Ughammadu ekwuola na-awakporo ebe esi amipụta mmanụ agbịdị nke si na Port Harcourt ruo n'Enugu ụgboro narị isii
kamgbe mbido afọ a.
O kwuru na etu o si kwuru ugbua, ha na-edozi, ndị ozu ohi mmamụ agbịdị a na-emebisi ya.
N'ofesi,
Nwaanyi Khashoggi chọrọ ịlụ ajụla ịhụ Trump
Ebe foto si, EPA
Cengiz kwuru na o cheghị na Trump ga-enyocha etu esi gbu Khasoggi
Agaghị m aga n'ụlọ ọcha America ga-ahụ Donald Trump.
Ọ bụ nwaanyị onye ntaakụkọ Saudi Arabia egburu egbu chọrọ ịnụ kwuru nke a.
Hatice Cengiz kwuru na o cheghị na Trump ga-ekwu eziokwu gbasara nyocha a na-eme maka ogbugbu Jamal Khashoggi
Cheta na-egburu Khashoggi n'ụlọọrụ Saudi dị na obodo Instabul.
Gere Nkeji ụtụtụ a:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
N'egwuregwu,
Usain Bolt bụ azụ anụ ụka
Ebe foto si, @Usain St. Leo Bolt
Usain Bolt bụ ọkacha agba ọsọ na mbaụwa
Nwoke kacha agba ọsọ na mbaụwa niile bụ Usain Bolt ka kwu chim na-ebum n'obi ya gbasara ị gba bọọlụ.
Otu onye so akaja ya bụ onye gbaburu Republic of Ireland bọọlụ bụ Andy Keogh juru ma Bolt ọ ga-agbanwu bọọlụ ma na-akọwa na nke mbụ ọgbara dịka ihe ị kpaọchị.
Ebe foto si, Getty Images
INEC ekwuola na otu ndọrọndọrọ iri asaa n'ime otu iri itoolu na otu ga-ewepụta ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019.
Ha kwukwara na ha ga-ewepụta aha niile ndị na-azọ ọkwa onyeisiala taa bụ ụbọchị fraide
N'otu aka ahụ
Ebe foto si, Getty Images
Minista na-ahụ maka ọkụ latrik bụ Babatunde Raji Fashola agwaala ndị Yoroba ha tụnyere Buhari na 2019 maọbụrụ na ha chọrọ ịrị ọkwa onyeisiala nke 2023
Ọzọ,
Ndịisiagha Naịjirịa nke akpọrọ Defence Headquarters Nigeria ekwuola na ha dị njikere maka ọkụ mmụọ Nnamdi Kanu kwuru na ọ ga-eweta.
Ha chere aka mgba kwuo na Kanu na-atụmatụ 777 ọhụrụ ha hibere ga-akwata ya.
Na mba ofesi
Ụmụaka ruru iri n'anọ emerụọla ahụ na mba China mgbe otu nwaanyị bu mma wakporo ha n'ụlọakwụkwọ Kindergaten.
Ndị uweojii anwụchiela nwaanyị ahụ ma kwukwa na ha amabeghi ihe mere oji awakpoo ụmụaka ahụ.
Onye otiegwu bụ Tiwa Savage agwaala ndị mmadụ na-akọ ya ọnụ na soshal midia maka ihe onyonyo ya na Wizkid mere akpọrọ 'Fever' ha gaa rie stew.
Gee Nkeji nke ụtụtụ a:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile