Ndị gburu Ochanya dị afọ 13 ga-ata ahuhụ - Ndị ngagharị iwe
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Ochanya: "Ọnwụ ya agaghị abụ na-efu" - Ndị ngagharị iwe

Ọtụtụ ndị mmadụ mere ngagharị iwe na Legọs maka ọnwụ Elizabeth Ochanya Ogbaje bụ nwata a nwakporo.

Ọrịa akpọrọ Vesicovaginal fistula (VVF) batara n’ahụ Ochanya ka mgbe di nwa nwanne nna ya bụ Andrew Ogbuja nwakporo ya.

Andrew Ogbuja bụ onyeisioche ngalaba ebe a na-amụta oriri na ọṅụṅụ na Mahadum Benue Steeti gwara ụlọikpe na Makurdi ka ha gbahara ya na emume a.

Ọbụghị sọọsọ Ogbuja nwakporo Ochanya, ụlọikpe a chọpụtara na nwa Ogbuja bụ Victor Inalegwu Ogbuja so kwa na ndị nwakporo nwata a.

Ugbua ndị uweojii na-achọ Andrew Ogbuja na nwa ya bụ Victor makana agbafuru ka mgbe ụlọikpe tọhapụ ha n’usoro akpọrọ ‘bail”.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: