Ekwenyeghi m na m ga-dị ime dịka m gbara afọ 66 - Ajibola

Ajibola Otubusin lụrụ dị ya bụ Samuel n'ọnwa Disemba afọ 1977 mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise.
"Ekweteghi m na adị m ime, mana mgbe igwe skan gosiri ihe na-eme n'ime afọ m, obi juputara m n'ọṅụ"
Ihe a bụ akụkọ nwaanyị mụrụ nwa mgbe ọ gbara afọ iri isii na isii dịka o chechara afọ iri anọ.
Nwaanyị a bụ Ajibola Otubusin lụrụ dị ya bụ Samuel n'ọnwa Disemba afọ 1977 mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise.
Dịka ihe egwuregwu Ajibola chere afọ iri anọ na-amụghị nwa ọbụla, ebe ndị ezinaụlọ di ya na ndị ọzọ na-akọ ya ọnụ amụghị nwa.
N'okwu ya "Amaghị m na m ga-eche afọ iri anọ na-amụtaghị nwa".
Samuel bụ dị Ajibola na-eche nwa ha n'ihu Chineke
Ajibola gara n'ihu kwuo na ọ gabigara ọrịa dị iche iche mana Chineke gwọrọ ya ọrịa ndị a site n'ekpere nakwa enyemaka di ya.
"Ọ bụ n'abalị iri abụọ na abụọ n'ọnwa Febuwarị afọ 2018 ka-achọpụtara na-adị m ime, mgbe anyị mechara ihe a na-akpọ "Artificial Insemination".
"E ruru n'ụbọchi iri abụọ nke ọnwa Ọktoba, m wee mụọ agadaga nwa nwoke site n'ịwa afọ".
"Ndị niile chịrị m ọchị na-akpọzi m onye Chukwu goziri".
Di na nwunye mụrụ ejima atọ