Nnamdi Kanu: Ihe gbara ọkpụrụkpụ n'okwu ya

Kanu

Onye ndu IPOB Nnamdi Kanu mere mgbasa ozi nke abụọ ya n'igwe Redio taa kamgbe ọ pụtagharịrị ihe ọzọ.

Na mgbasa ozi a bụ nke ọ malitere site na ị nabata ndị otu IPOB na ndị ọzọ na-ege ya ntị.

O kelere onye bụbu minista ụgbọelu bụ Fani Kayode na onye bụbu gọvanọ Ekiti Steeti bụ Ayodele Fayose na mbọ ha na-agba n'ikwupụta uche ha na Naịjirịa.

Nnamdị Kanu n'okwu ya sị na ọ bụ ihe pụrụiche ị bụ onye Biafra karịsịa onye otu IPOB ma too ndị nille ka nwere ntụkwasị obi n'ebe ọ nọ.

O kwuru na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari anwụọla kamgbe ihe karịrị otu afọ na onye na-anọchi anya ya ugbua bụ onye akpọrọ Jubril si na mba Sudan.

Image copyright @bashirahmad
Nkenke aha onyonyo Muhammadu Buhari gara njem ọrụ na Lọndọn

Ọ gara n'ihe kwuo na ọ ga-eme emume n'ọnwa ọzọ bụ ebe ọ ga-egosi onyonyo ga-ekpuhe eziokwu banyere ọnwụ Buhari na nnọchi Jubril.

Kanu boro ndị gọvanọ mpaghara ọwụwanyanwụ na Ohanaeze Ndigbo ebubo na ha kpara nkata ka e gbuo ya na ndị otu IPOB.

Kanu kwuru na ya ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ kwesiri inwe mkparịta ụka n'ime ọnwa Seputemba ahụ awakporo ụlọ ya.

Image copyright Elliot Ugochukwu Ukoh

Nnamdi Kanu kwuru na ihe Dave Umahi gwara BBC Igbo bụ eziokwu, o kwuru na ọ gwara Umahi gaa wetara ya ihe n'Abuja mana ọ gbara aka lọta.

O kwuru na ihe ndị ndu mpaghara ọwụwanyanwụ maara bụ naanị akpa ha karịa ọ dị mma ndị Igbo.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIPOB: A taghịm Nnamdi Kanu ụta

Kanu kwuru na ọ bụ onye akpọrọ Ango Abdulahi na ndị Fulani ndị ọzọ magidere ndị ndu ọwụwanyanwụ ka ha machie IPOB.

Ọ gara n'ihu katọọ nwụchi anwụchiri ndị ụmụnwaanyị IPOB n'Owerri na onweghi onye nwere ike ikwu okwu n'ala Igbo banyere nke a.

Kanu kwuru na Ohanaeze ndigbo ga-anọ na "mmachi" gọọmentị etiti nyere ha dịka ndị ohu nke bụ na ha enweghi ihe ọbụla ha ga-emeli na Naịjirịa.

Kanu katọrọ gọọmentị Naịjirịa maka nnupuisi n'iwu na-achị obodo bụ nke o kwuru pụtara ihe n'ọchịchị dị ugbua.

O kwuru na ndị ọchịchị Naịjirịa chọrọ imechi ihe niile gbasara IPOB na nwereonwe Biafra site n'ụzọ ịkpachi ego na ihe ndị ọzọ.

N'ikpeazụ Kanu kwuru na IPOB ka kwụsi ike na agaghị enwe ntuliaka ọbụla na mpaghara ọwụwanyanwụ n'afọ 2019.

Gee onu Nnamdị Kanụ na Sụpirisụpiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGee ọnụ okwu Nnamdi Kanu na sụpirisupiri

Akụkọ ndị ga-amasị gị: