Ụlọọrụ onyeisiala akatọọla PDP maka ikwu na Buhari ga-egosirịrị asambodo ya

Akụkọ ndị dị mkpa taa

Ụlọọrụ gọmentị etiti ekwuola uche ha maka asambodo Buhari

Image copyright BBC/Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na-ebo Onyeisiala Muhammadu Buhari na o gosighị asambodo ya were bata n'ọchịchị na 2015

Ụlọọrụ onyeisiala agwala ndị na-esi onwu maka iwepụta asambodo Muhammadụ Buhari ha ga gbara ọgwụ ha ṅụọ.

Odeakwụkwọ mgbasa ozi Onyeisiala Buhari bụ Femi Adesina kpọrọ ndị na-eme otu ndị ọnọnkịtị enwe efe.

ACF asaala Nnamdị Kanu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nnamdị Kanu pụtara ihe ọzo na onwa Ọktoba ka ọ na-ekpe ekpere na mba Izrel

Ndị otu Arewa Consulative Forum echerela Nnamdị Kanu bụ onye ndu Ipob aka mgba maka okwu ọ tụpụrụ ha na okwu mbụ ya kemgbe ọ pụtara ihe.

Onyeisi otu ahụ bu Yerima Shettima kwụrụ na okwu Kanu maka ịkewe Naịjirịa bụ mba a na-abara agụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị an-eme ncheta ndị egburu na Pittsburgh

N'ofesi, akpọpụtala aha ndị egburu na nwakpo ahụ emere na ụlọnzụkọ nke Pittsburgh na mba Amerika.

Ụmụnwanne abụọ na di na nwunye so na ndị isi ha alara na ya bụ nwakpọ nke mmadụ iri na otu (11) nwụnyụrụ anya pii.

Chelsea ji ọkpụ anọ zuo Burnley ike n'ahụ tata

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Chelsea meriri ndị Burnley ọkpụ 4 - 0

N'egwuruegwu, Chelsea ewerela ọkpụ anọ a asataghị otu duo ndị Burnley ụlọ na-egwuruegwu ha gbara tata.

N'otuaka ahụ, Crystal palace na Arsenal ji ọkpụ abụọ gbaa onwe ha onye naba onye naba.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Họpụtanụ ndị ndu gụrụ akwụkwọ - Sanusi

Image copyright Getty Images

Onye Emir nke Kano bụ Muhammed Sanusi n'ime emume mpụta n'ụlọakwụkwọ nke Mahadum Nile dị na Naịjirịa bụ nke e mere ụnyaahụ kwuru na ọtụtụ ndị ndu Naịjirịa bụ ndị na-agụghị akwụkwọ.

O Kwuru ka ndị Naịjirịa saa anya ha na mmiri n'ịhọpụta ndị ndu gụrụ akwụkwọ ma mara uru dị n'agụmakwụkwọ.

Ndị iro m chọrọ igbu m - Nwoye

Nkenke aha onyonyo Ben Nwoye, onyeisi ndị APC n'Enugwu

Onyeisioche Pati APC n'Enugu Steeti bụ Ben Nwoye a gbanarịla ọnwụ ya dịka ndị oji egbe wakporo ụlọ ya dị n'Independent Layout nke Enugwu Steeti.

Nwoye kwuru na ndị a wakporo ndị uweojii na-echekwa ụlọ nche ya ma merụọ otu onye n'ime ha ahụ bụkwanụ onye na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua.

N'ofesi

Image copyright Google

A gbagbuola mmadụ iri na otu n'ụlọ nzukọ a kpọrọ 'Tree of Life' dị na Pittsburgh nke Pennsylvania mba Amerịka dịka ha na-eme ofufe nroh.

Onye a na-eche mere nke a bụ otu nwoke a kpọrọ Robert Bowers dị afọ iri anọ na isii bụkwanụ onye nọ n'aka ndị uweojii ugbua.

N'egwuregwu

Image copyright PETE WHITE

Ụgbọelu Helikọpta onye nwe otu egwuregwu bọọlụ Leicester City akpọkasịala dịka ọ na-achọ i si n'ọgbọ egwuregwu ha efepu ụnyaahụ.

Cheta na Leicester City bụ ebe Kelechi Iheanacho na Ndidi na-agba bọọlụ gbachara asọmpi ha na ndị West Ham United tupu nke a a na-eme.

Gee Nkeji nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionTony Elumelu tinyere N1.8m n'ahịa akị oyibo m - Chigozie