Biafra: Onye bụ Mama Biafra?

Ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe

Ndị uweojii nwụchịrị Mama Biafra ụbọchị Wenezde 24-10-18 maka na ha sị na ọ na ere akwụkwọ mgbasa ozi Ipob.

Ha kpụgara ya ụlọikpe bụ ebe nyere ya aka mbee na ego dị na puku narị naira atọ.

Ụmụnwaanyị Ipob: Buhari na-achọ nnukwu okwu

Ikpe ya dị n'aka ọkaikpe Linda Ugboaja n'ụlọikpe ime obodo dị n'Umuahia.

Mama Biafra gwara ụlọikpe n'ikpe adịghịrị ya.

Onye bụ Mama Biafra?

Ezigbo aha nwaanyị a bụ Felicia Ejezie.

Ọ gbara afọ karịrị iri asaa.

Mama Biafra bụ onye Eziata Okpoto Umuisiobu nke Bende dị na okpuru ọchịchị Bende n'Abia steeti.

Mama Biafra nụrụ dị onye Anambra steeti na nwata mgbe a lụrụ agha Biafra na 1963.

Felicia mụtara ụmụ anọ bụ ndị bi n'ala bekee nke dịọkpara ya bụ onye agha na mba Amerịka.

Ọ rụbụrụ ọrụ na "Nigeria Ports Authority" bụ ebe ọ nọ laa ezumike nka rue ugbua.

Gịnị mere eji akpọ ya Mama Biafra?

Di Felicia bụ onye agha Naịjirịa manyere ya ka ọ lụwa ya mgbe ọ perempe a na-alụ agha Naịjirịa na Biafra.

Ihe mere o jiri zawa mama Biafra bụ maka ihe ọ gabigara mgbe agha.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a