Tony Anenih: Ị ma ihe jịkọrọ ya na Nnamdi Azikiwe?

Ebe foto si, AFP
A mụrụ Anthony Akhakon 'Tony' Anenih na Uzenema-Arue dị n'Uromi nke Edo steeti n'afọ 1933.
Ọkwa ikpeazụ o nwere bụ Minista na-ahụ maka ihe gbasara ọrụ n'ụlọ obibi n'afọ 1999 mgbe Olusegun Obasanjo rịrị ọkwa onyeisiala.
Amalitere itu ya aha 'Mr Fix It' n'ihi mbọ ọ na-agba n'ihe gbasara ntuliaka ọ kachasị etu o si nye aka chiburu Edo steeti bụ Samuel Ogbemudia aka n'imeri ntuliaka ọkwa gọvanọ n'afọ 1983.
Ụfọdụ ụlọntaakụkọ dị na Naịjirịa na-ekwu n'ọnwụrụ ụnya ahụ n'ụlọọgwụ dịka ọrịachara ọrịa ihe ruru otu izuụka.
Lee ihe ise ị na-amaghị maka ya ebe a:
Ebe foto si, AFP
- 1. Tony Anenih bụ bu otu n'ime ndị uweojii na-eche Nnamdi Azikiwe nche mgbe Azikiwe bụ Gọvanọ General ala Naịjrịa.
Ebe foto si, Getty Images
- 2. Mgbe onyeisiala Muhammadu Buhari chịburu Naijirịa n'okpuru ndịagha, a tụrụ Anenih nga ihe ruru ọnwa iri n'asatọ n'ihi na ọ bụ ọgaranya.
- 3. N'afọ 2017, nwunye ya bụ Patricia Anenih nakwa otu nwa ya nwoke bụ Eugene Anenih nwụrụ n'ọnwa Mee nakwa ọnwa Epreelu.
- 4. Anenih bụ aka na-achịkọta ọsọ ọkwa onyeisiala nke Olusegun Obasanjo zọrọ n'afọ 1999 nakwa afọ 2003.
- 5. E boro ya ebubo mpụ ego ruru ijeri naira narị atọ mgbe ọ nọ n'ọkwa n'okpuru Olusegun Obasanjo.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị