Kaduna Crisis: Ndịagha ụgbọelu agala njem enyemaka na Kaduna

Ndịagha ụgboelu Naịjirịa Image copyright NAF

Ndịagha ụgboelu nke Naịjrịa akpọrọ 'Nigeria Airforce' na bekee ebidola ịziga ụgbọelu nakwa ngwa agha ndị ọzọ na Kaduna.

N'ime akwụkwọ ozi ha zipuru, ha kwuru na nke a bụ iji nye aka cheekwa ndụ nakwa akụnaụba ndị mmadụ bi na mpaghara Kaduna.

"Atụmatụ a bụ iji kwalite atụmatụ ndị ọzọ a na-eme gbasara nchekwa na steeti ahụ" bụ ihe akwụkwọ ozi nke Ibikunle Daramola bụ ọnụ na-ekwuchitere ndịagha ụgbọelụ Naịjirịa binyere aka na ya.

Cheta na ọgbaghara dara n'obodo Kaduna kemgbe ngwụcha izuụka gara aga mgbe ụfọdụ ndị ntoroọbia malitere ịlụ ọgụ nakwa ịgbu onwe ha.

Image copyright NAF

Gọọmentị steeti ahụ machiri ngagharị mmadụ nakwa ngwaahịa site n'ụtụtụ rue abalị iji hụ na akwafughi ndụ ọzọ.

Image copyright NAF

Ngwaagha ndịagha ụgbọelu Naịjirịa zigara Kaduna gụnyere ụgbọ helịkọpta abụọ nakwa otu ụgbọ na-achịkọta ozi nke akpọrọ "Intelligence Surveillance and Reconnaissance (ISR) aircraft" na Bekee.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị