Nnamdi Kanu: Etu m si gbalahụ ndị agha Naịjirịa

Nnamdi Kanu Image copyright Getty Images

Nnamdi Kanu bụ onyeisi ndị Ipob gbagara Izrel oge ndịagha wakporo ya, kwuru na ndị nọ ya n'akụkụ zopuru ya.

N'ime ihe onyonyo ndị Kani Pbc (Israeli Public Broadcasting Corporation) ebe a gbara Kanu ajụjụ ọnụ, ọ kọwara etu o si gbalahụ ndị agha Naịjirịa oge ha bịara ime Egwu Eke n'ụlọ nna ya n'Afaraukwu, Abịa steeti.

Kanu kwuru na ụfọdụ ndị na-akwado ya zopuru ya tupu ndịagha Naịjirịa abịarute n'ọnụụlọ ya, ma zopukwa ya na Naịjirịa ebe o si gaa mba Izrel ka o nwetachara onwe ya.

O kwuru na ọ gara Izrel maka na ọ ma na ọ bụ naanị ebe ahụ ka ọ ga-anọnwu na-enweghị mmekpahụ ọbụla, na ọ gaghị Briten maka na obi erubeghi ya ala ịga ebe ahụ.

Cheta na ndị agha Naịjirịa bịara gbaa Egwu Eke ahụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba, 2017.

Ihe ise Nnamdi Kanu chọrọ n'aka gọọmentị Naịjirịa

A gụpụ mwereonwe Biafra n'akụkụ, Kanu kpọpụtara ihe ole na ole o kwuru sị na ọ gwara gọọmentị Naịjirịa ka o mee.

O kwuru na o degaara gọọmentị akwụkwọ ozi iji gwa ha mezuo ebumnobi ya.

  1. Kanụ chọrọ ka e mepee ihe Bekee kpọrọ 'seaport' na Pọtakọt, Kalaba nakwa Wọrị.
  2. Kanụ chọrọ ka a gwọchaa osimiri Naịja.
  3. O kwuru ka e mee ka ụgbọelu na-esi Enugwu, Kalaba na Pọtakọt na-efega mba ofesi.
  4. O kwuru na ọ chọrọ ka gọọmentị tọghapụ Ibrahim El-Zakzaky bụ onyeisi ndị Shiite nakwa Sambo Dasuki bụbụ onye ndụmọdụ n'ihe gbasara nchekwa obodo.
  5. Ọ chọkwara ka e nyochaa ihe ọ kpọrọ "ogbugbu ndị ezinaụlọ IPOB n'Ọnịcha, Aba, Enugwu, Ụmụahịa, Asaba nakwa Pọtakọt."

Akukọ ndị ga-amasị gị: