Oby Ezekwesili ekwuola na ya a Ipob ga-enwe mkparitaụka ma ọ chịwa Naịjirịa

Ezekwesili katọrọ pati APC na PDP maka ndị ha weputara ịzọ oche onyeisiala
Onye na-azọ oche onyesiala n'okpuru pati Allied Congress Party of Nigeria (ACPN) bụ Oby Ezekwesili ekwuola na ọ ga-akpọkete ndị otu niile na-agba isiakwara, gee ha nti ma mata ihe bụ iwe ha.
Ezekwesili kwuru nke a n'ọgbakọ o kpokobara ịzị ndị ntakaụkọ ozi gbasara ndị che na ọgaghị emeri na ntuliaka na-abịanụ.
O kwuru na ọ bụ ya bụ onye ga-achịnwụ Naịjirịa ugbua makana ndị otu pati PDP na APC agaghị emetanwụ ihe dị na ya.
Ezekwesili kwuru na otu PDP na APC bụ otu pati nke ya ga-akpọ "Butiku" maka na ndị ha wepụtara ịzọ ọkwa onyeisiala bụ otu ihe n'agwa.
Ọ gwara ndị ntorobia bịara ọgbakọ a ka ha ghara ịtụnyere ndị ga-eme ka ha nọrọ n'ahụhụ nakwa na oge eruola mgbe ha ga-eji kwuo na o zuola nke ikpeazu.
Ezekwesili kwuru na ọ ga-ege ndị ọ na-enweghị ka ọha ha nti
Ezekwesili kwuru na ọ ga-enye ndị na abụghị ndị ọrụ gọọmenti ohere ka ha wulite akụ na ụba Naịjirịa ma ọ banye oche onyeisiala na 2019 ruo ya aka.
O jikwa ohere a kele ndị be Tony Anenih onye bụ bu onyeisi n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ PDP ma rịọ ka Chukwu kasie ha Obi.
Ihe asatọ Ezekwesili kwuru na ọgbakọ mbasa ozi a
- O kwuru na o nwere aha ọma na mbaụwa niile
- O kwuru na ọ ga-eme ka ụmụ Naịjirịa ruru nde asato pụọ n'ụbiam
- APC na PDP bụ nwanne, Chukwu agaghị ekwe ka ha chịa ọzọ.
- Akpara m ike mgbe enyere m ohere iso na ndị rụrụ ọrụ na gọọmentị n'afọ 2007.
- Ụmụ Naịjirịa kwesiri ịjụ ndị tagoro akị n'ọchịchị bụ ndị na-achọ nanị akpa ha.
- Ọ gụpụtara akwụkwọ nchọpụta gosiri na akụnaụba Atiku ga-ada mmiri ma ọ bụrụ na o merighị ndọrọndọrọ a.
- Ọ katọrọ ọchịchị Buhari kwuo na mmerụaka agahị alusanwụ mmerụaka ọgụ.
- O kwuru ọtụtụ ọrụ ọma ọ rụụrụ Naịjirịa mgbe o nwetara ohere dịka onye ọrụ gọọmentị.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị