Abuja: Ihe ruru mmadụ 11 anwụọla n'ọgbaaghara ndị Shi'a

Shiite na Naịjirịa Image copyright Facebook/shaheed Asperger
Nkenke aha onyonyo Ndị otu ụka Alakụba na-eme ngaghị iwe maka ndị isi ha gọọmenti etiti ejieji

Ozi na-eru BBC ntị ugbua ekwuola na ihe ruru mmadụ iri na otu anwuola na ọgbaghara ndị na etiti ndị agha Naijirịa na ndị "Islamic Movement of Nigeria."

BBC enweghi ike ikwu ka ọnụ ọgụgụ ndị a asị na ha nwuru ọ bụ eziokwu ka ọbụ ụgha.

Anyị nwụchiri ndị Shiite 115- Uweojii

Akụkọ dị mkpa taa: Tọghapụ Elzakzaky - Shiite

Ọgbaaghara na-akpọtụ n'ụzọ Maraba bụ nke dịketere Abuja.

Onye nta akụkọ BBC tọrọ na gbachịgbachị dị n'ụzọ ahụ kọrọ anyị nke na-akpọtụ na-ebe ahụ kemgbe ehihie.

Image copyright IMN
Nkenke aha onyonyo Sheikh Ibrahim Zakzaky bụ onye ndu ndị Islamic Movement nke Naịjirịa eji kemgbe Disemba 14 2015

Ndị akaebe nọ ebe ihe na-eme gwara BBC na ndị otu Shiite a na-agara onwe ha mgbe ha ruru ebe ndị agha na-echenche, ndị agha ahụ sị ha lachie azụ.

Ma di Shiite ahụ kpọrọ ekwo nkụ na-agara onwe ha.

Ndị akaebe sị na mgbe dị agha na-agbali egbe elụ ka were chụsaa ndị ngagharị iwe a, kama ha ga-agbawa ọsọ, ha atụwa ha okwute.

Onye nta akụkọ BBC nọ ebe ahụ sị na ya na-anụ mgbọ egbe aghara aghara ebe gọmentị nyegoro iwu ka emechie ụzọ awaraawara gawara Kubwa maka ọgbaagha ahụ.

Ka a na-ekwu, ka a na-ekwu ọtụtụ mmadụ abanyele sochal midia maka ya bụ okwu.

Ụbụchị ụka ka ndị agha Naịjịrị kwetere na naanị madụ atọ ndị Shiite anwụrụ anwụ ebe ndị otu ha abụọ meruru ahụ na ọgbaaghara dara n'ụzọ Zuba na Satọde.

Ka ọ dị ugbua ndị agha ekeele nkwụcha na ọtụtụ ebe n'Abuja bụ isi obodo Naịjirịa.

Akụịkọ ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye ndu ndị MASSOB bụ Ralph Uwazuruike gbọrọ ọkụ n'ọnụ na mkparịta ụka ya BBC

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a