Sister gbapụrụ n'ụka na-akwazi iko aghara aghara

Ebe foto si, Getty Images
Onye nun bụ nwaanyị ji onwe ya chụọ aja n'ụka ma ṅụọ iyi ị dịasọ, ị bị ndụ ụbịam nakwa ị rubeisi na-okwukwe ụka
Otu nwaagbogho Sista n'okwukwe katọlik ebuola awoo n'ogige kọnvent ha.
Yudy Pineda Vasquez bụ onye gbara afọ iri abụọ na asatọ (28) bara ogige konvent mgbe ọgbara afọ iri n'obodo ya bụ Colombia.
Yudy sị na mgbe ọkụkọ gbasara egwusi bụ mgbe otu nwokorobịa bịara n'ogige ha maka ịkwadọ ụmụaka ga-anata oriri nso.
Ọ sị na ya bụ nwokorobịa riri ya obi nke bụ na ọ malitere ihu ya n'anya.
Yudel kọsaara ibe ya ka ya bụ nwokorobịa sị rịe ya obi.
Onye ọkọsaara ihe a gwara ya na ọ kaara ya mma na ọ ji nwanyọ pụọ mgbe ya bụ mmiri ka dị n'ogwe ọkpa.
Yudel sị na "ya bụ ihe wutere m na mbụ, mana nke ahụ agaala".
Ugbua; "udo na ọṅụ juputara m obi".
Ebe foto si, Getty Images
Onye nun bụ nwaanyị ji onwe ya chụọ aja n'ụka ma ṅụọ iyi ị dịasọ, ị bị ndụ ụbịam nakwa ị rubeisi na-okwukwe ụka
"A na m agbambọ ịme ihe dị ka ezigbo mmadụ. Anaghị m agha ụka, ekpere maọbụ mụọ anya abalị".
Ugbua ọrụ Yudel bụ ime ihe onyonyo ịkwaiko nke bụ ihe oji erizi ihe ugba.
Mana agwa ndị a anaghị egbochị ya ịmejuputa iwu ụka.
Ị mata ka ụdị ihe a ọnwere ike ịme n'Igbo, otu onye sista ụka katọlik na-achọghị ka anyị kpọọ aha ya sị na ya bụ ụgụrụ abụghị mbụ oyi.
Ọ sị na "ndị sista ụfọdụ na-adapụ na-okwukwe kwamgbe kwamgbe ma ihe ha meweziri mgbe ha pụrụ bụ akụkọ ọzọ".
Sista kwụrụ na ọtụtụ ihe na-ebute ndị sista ịdapụ n'okwukwe.
Ụfọdụ ha na-eji aka ha sị na ha achọghịzị, ụfọdụ bụkwa maka ihe ha metere ka eji asị ha pụọ.
Ọ sịkwa na; "ọbụrụ na ihe onye ahụ mere abụghị ihe mmechụ ihụ, na onweghị ihe ga-egbochi onye ahụ ịnata oriri nsọ".
"Ịgbapụ na kọnvent abụghị njọ ogbugbu. Ọ gaghị egbochi onye gbapụrụ na kọnvent ị ga ụka maọbụ ị nata oriri nso." Onye Sista kwuru.
Akụkọ ga-amasị gị