Trump: Aga m akwụsị ndị mba ọzọ amụrụ n'Amerịka ị bụ ndị mba anyị

Akụkọ dị mkpa

Nwa mba ọzọ amụrụ na Amerịka agaghị abụzị nwafọ Amerịka - Trump

Melania Trump bụ nwunye Donald Trump ku nwata oge ọ bịara njem nleta n'Afrịka

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump aṅụọla iyi na ọ ga-akwụsị ikike iwu kwuru na nwa ndị mba ọzọ a mụrụ na Amerịka ga-abụ nwafọ mba Amerịka.

Ọ gbarụrụ ihu na ọ bụ naanị Amerịka ka ụdị iwu a dị ire, ma kwuo na ọ ga-agbanwe iwu a ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị tinyere aka n'akwụkwọ.

Trump kwuru na nke dị mkpa maka ibelata ọnụọgụgụ ndị mmadụ na-abata n'Amerịka kwa mgbe.

Buhari aṅụọla iyi maka ọgbaghara Kaduna

Buhari na El-reufai

Ebe foto si, @NGRPresident

Onyeisiala Muhammadu Buhari aṅụọla iyi na ọ ga-ememina ndị aka ha dị n'ogbugbu ndị mmadụ na Kaduna Steeti.

N'aka nke ọzọ ndị uweojii na ndị otu Shiite na-achịpụ ya na mpaghara Wuse dị n'Abuja dịka ọtụtụ ụgbọala gbarala ọkụ.

Nye anyị nghazigharị obodo were onyeisiala - OYC

Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo

Ebe foto si, Kingsley Dozie

Ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo nke onyeisi ha bụ Kingsley Dozie tinyere ọnụ na ka enye ha nhazigharị obodo karịa onyeisiala n'afọ 2023.

Ha gbarụrụ ihu n'okwu minista na-ahụ maka ọkụ latrik bụ Babatunde Fashola kwuru na ọ bụ ndị ndịda anyanwụ nwe ọkwa onyeisiala n'afọ ahụ.

N'ofesi

Niels Hogel bụ nọọsụ ji ọgwụ gbagbuo ndị ahụ na-adịghị nọ n'ụlọọgwụ

Ebe foto si, Getty Images

Otu onye nọọsụ na mba Jamini akpọrọ Niels Hogel ekwupụtala na o ji ọgwụ gbagbu otu narị mmadụ dịka a na-ekpe ya ikpe.

O kwuru na ọ bụ ka owere ya gosi ndị nọọsụ ibe ya na ọ ga-etuteli ndị ọ gbara ọgwụ ahụ.

N'egwuregwu

Dele Alli batara n'afọ 2015 enyeela gọọlụ iri anọ na asatọ n'asọmpi otu narị na iri ise na atọ.

Ebe foto si, AFP

Onye na-agbara Tottenham bọolụ bụ Dele Alli etinyela aka n'akwụkwọ ga-agbatị ọnụnọ ya na Tottenham rue afọ 2024.

Nwa amadịa batara n'afọ 2015 enyeela gọọlụ iri anọ na asatọ n'asọmpi otu narị na iri ise na atọ.

Nkeji abalịa:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri:

Aha onyonyo,

'Ndị ibe anyị na-azọkwasa anyị ụkwụ n'isi' - Uko

Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ

Gọvanọ ndị na-achị steeti iri atọ na isii dị na Naịjirịa na osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ga-enwe nzukọ taa ebe ha ga-etikọta isi ọnụ kpebie maka ụgwọ opekatampe.

Osinbajo

Ebe foto si, Getty Images

Mịnịsta na-ahụ maka akụnaụba obodo bụ Zainab Ahmed nakwa nke na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige, ga-esonye na ya bụ nzukọ.

Na mba ofesi,

Onyeisiala mba Jamini bụ Angela Merkel, ekwuola na ọ gaghị azọ ọkwa ọchịchị ọzọ ma oge ya gwụ n'afọ 2021.

Merkel

Ebe foto si, Getty Images

O kwukwara na ọ gaghị azọ ọkwa 'onyeisi' otu pati ya bụ CDU ọ bụ onyeisioche ha kemgbe afọ 2000, mgbe ntuliaka ya ga-abịa n'ọnwa Disemba.

N'akụkọ ọzọ,

A ka na-achọ ndị mmadụ ruru otu narị na iri asatọ na itoolu nọ n'ụgbọelu Lion Air ahụ dabara n'ime okeosimiri n'obodo Jakarta dị n'Indoneshia.

Ngwongwo si n'ụgbọelu Lion Air

Ebe foto si, AFP

Ka ọ dị ugbua, ezipula teknụzụ a na-akpọ sonar nakwa drone iji nyere aka chọta ma e nwere ndị dị ndụ, ebe ọ bụ naanị ngwongwo ndị mmadụ na akụrụngwa si n'ụgbọelu ahụ ka a ka na-agụpụta na mmiri ruo ugbua.

N'egwuregwu,

Otu Real Madrid achụọla Julen Lopetegui ụkwụ eru ala na-erughi ọnwa ise o bidoro ọrụ.

Lopetegui

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Mba Spen chụrụ Lopetegui kpọ ha gaa asọmpi Iko Mbaụwa nke 2018n'ọnwa Juun ka ha chọpụtara na ọ chọrọ ịhapụ ha gafee Real Madrid

N'otu aka ahụ, Manchester City ji otu ọkpụ goolu merie Tottenham ka ha zutere n'asọmpi Premier League n'abalị ụnyaahụ.

Gee akụkọ niile a n'otu nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri nke taa:

Ralph Uwazurike bụ onye ndu ndị MASSOB kwuru ihe o che maka Biafra nakwa ihe mere o ji kwuo na ọ bụzị ihe e ji egwu egwu.

Aha onyonyo,

Onye ndu ndị MASSOB bụ Ralph Uwazuruike gbọrọ ọkụ n'ọnụ na mkparịta ụka ya BBC