Uwazurike: Ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ihe o kwuru maka Biafra

Ralph Uwazurike Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Dịka Nnamdi Kanu, Uwazurike gakwara mkpọrọ maka ịchọ nnwereonwe Biafra

Ụfọdụ ndigbo anabataghị ihe Ralph Uwazurike bụ onye bidoro otu Massob gwara BBC Igbo gbasara ọnọdụ Biafra ugbua.

N'okwu ya, Uwazurike kọwara na ọ ghọtaghị etu ụfọdụ ndị mmadụ si ekwu na ha chọrọ Biafra ebe ọ bụrụla ihe nọ anọ.

O kwukwara na ụzọ e si achụ ya bụ nnwereonwe ugbua butere nkwafu ọtụtụ ọbara.

Ihe a na ihe ndị ọzọ o kwuru na mkparịtaụka ahụ kpalitere ọtụtụ okwu n'ọnụ ma ndị kwadoro okwu ya na ndị akwadoghị ya.

Ihe a na-ekwu

Otu n'ime ndị kwuru uche ha bụ Modestus Ajaero dere na ọ bu nkọgheri ka Uwazurike na akọgheri:

Onye ọzọ bụ Anike Sunday kwuru sị "Nwoke a erego Biafra nara ego ya kamgbe, ọ bụ mma ihu abụọ. Ekene dịrị Chukwu na ndigbo ibem aghọtala nke a, anyị agbaala ya alụkwaghịm."

Theodore Okafor kwuru sị "Ralph Uwazurike bụ onye ntaji anya. Wepụ anya gị na ọnụ gị n'arụ Nnamdi Kanu. Ị dị ka onye ọgbaa bọọlụ nọ naanị ipiaji ndị ji bọọlụ ụkwụ.

Ọ bụ Mazi KANU mere ka aha Biafra pụtawanye ihe. Ọ bụghị ihe Dim Chukwuemeka bu n'obi banyere ime ka nnwereonwe anyị nwee isi ka ị na-emezi. Ọ dịkwa m ka ị merụọla aka gị n'ụzọ ije site n'irikọ nri na ịṅụkọ mmiri gị na ndị anyị che na ha na-emegide anyị."

Nze Antho Anurugwo kwuru "Nwoke m, ịmaghị ihe ị na-ekwu. Kedụ nke bụ ha nọ n'ime Biafra na-achọ Biafra? Etu ala Biafra dị taa ọ dị gị mma n'obi? Ihe a abụghị Biafra nke anyị na-achọ. Biafra nke anyị na-achọ bụ ebe a ga-enwe ezigbo ndị ọchịchị, ezigbo ụzọ, ọkụ na mmiri mgbe dum, ezigbo ọchịchị onye-kwuo-uche ya, ebe a ga-eme onye ọbụla ka e mere ibe ya. Ị nwaala ike gị inye anyị Biafra ma onweghi isi, hapụ Nnamdi Kanu ka ọ nwaa nke ya."

Ọ pụtara na enweghị onye kwadoro Uwazurike n'okwu ya?

Lee ihe ndị ọzọ kwuru ebe a:

Lee ihe nkiri ebe Uwazurike na BBC Igbo nwere mkparịtaụka ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye ndu ndị MASSOB bụ Ralph Uwazuruike gbọrọ ọkụ n'ọnụ na mkparịta ụka ya BBC

Akukọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara